Saraki azaghachila ndị uweojii

Naịjirịa na Sineti

Ebe foto si, NASA/facebook

Nkọwa foto, Bukola Saraki sịrị na-egwu anaghị atụ ya ịza ndị uweojii oku

Onyeisi ụlọ ukwu omeiwu bụ Bukola Saraki agọọla ụkwụ na aka n'aka ya adịghị na-ebubo a na-ebo ya gbasara ohi ndị oji egbe eri zuru na Offa, n'ọnwa Eprelu afọ a.

Ndị uweojii, n'akara twitter ha kpọrọ Saraki ka ọ bịa zara ọnụ ya maka nke a.

Agbanyeghị na ndị ọrụ Saraka sịrị na ha enwetebeghị ya bụ ozi nke ndị uweojịị sị na ha zịrị, ha depụtara akwụkwọ n'ịzara ọnụ ha na ya bụ ebubo.

N'ime akwụkwọ ahụ nke Yusuph Olaniyonu bụ onye ndụmọdụ Saraki na mgbasa ozi binyere aka, Saraki si na "Sị mata amata na-onweghị mgbe onye dịka ya ga-esị tinye aka n'ohi egbe na be ha. Mgbe ya bụ mkpamkpa kpara na Offa, abụ onye mbụ nwere agba gara ebe ahụ bụ ebe m nọọ na nke Eze obodo kpọọ onyesis ndị uweojii a na-ebo m ebubo a rịọ ya ka otinye anya na mmiri maka nchekwa obodo."

"Uwa ga-echeta na n'ọnwa Mee 16, 2018 a gwara ndị omeiwu na Sineti na Gọvanọ anyị bụ Abdulfatai Ahmed gbaara m ama na onyeisi ndị uweojii na-akpa nkata ịmetọ aha m n'ihe nrụrụaka ndị otu nzuzo.''

Nke a mere ka amụma ọjọọ ha a kpụọ afọ n'ala. Ugbua ọbụrụla ohi ezuru na ụlọakụ Offa ka ha jideziri aka ."

"Amụma ọjọọ a bụ ka ha were mechuo m ihu. Nke a bụ mbọ ọ ọchọrọ ịbọ maka oku ndị Sineti kpọrọ ya ka ọ bịa zara ọnụ ya maka oke ọgbụgbụ mmadụ nke karịrị na Naịjirịa ụgbụa".

Saraki sịrị na "amụma ọjọọ a ga-ada dị ka nke mbụ dara ma wekwara ohere a na-ekwusi ike n'aka m adịghị na ohi maọbụ ihe nrụrụaka ọbụla".

Saraki kwere nkwa na dịka onye na-asọpụrụ iwu obodo na mgbe ndị uweojii kpọrọ ya dịka osiri kwesi, na ya ga-aza ha na-etufughị oge.

Na mechi Saraki sịrị na ọ bụ ihe jọgburu udele ma sigbuo nkakwu na eji udi ihe dị otu a akpagbu usoro omebe iwu ma na-etinyekwara ha ụkwụ na ịrụpụta ọrụ ha. Ọ sị na nke a bụ "ezigbo ọgbataụhie nyere ọchịchị onye kwuo ụche ya na Naịjirịa".

Akụkọ ndị ga-amasị gị: