Nigerian foods: Ihe ị na-amaghị maka ụkwa ị na-eri

Ọtụtụ ndị Igbo ma ụkwa ma na ha amaghị etu esi emepụta ụkwa tupu ọ bụrụ ihe a na-eri eri.
Ụkwa nwere osisi nke na-amịpụta mkpụrụ ụyọkọ buru ibu nke Bekee na-akpọ 'breadfruit'. Azụ mkpụrụ ụyọkọ ya na-acha akwụkwọndụ akwụkwọndụ, ebe mkpụrụ mkpụrụ dị ya n'ime na-emepụta ihe anyị na-akpọ ụkwa.
Ụyọkọ ụkwa chaa, o si n'elu osisi ya daa n'ala, a hapụ ya ka ọ ree ure tupu a kụwaa ya ma wepụta ụkwa nke a na-esi esi. Ya mere ndị Igbo ji asị na 'ụkwa ruo oge ya ọ daa'.
Tupu e rie ụkwa, ọ ga-agabiga ụzọ dị icheiche dịka:
- Isi ya esi
- Ighe ya eghe
- Maọbụ ịhụ ya n'ọkụ
Ngwa nri eji esi ya
- Ose
- Nnu
- Ụkwa
- Mmanụ nri
- Ụfọdụ na-etinyekwa yabasị, maggị nakwa ịsha
- Ụfọdụ na-etinye azụ ọkpọọ ebe ụfọdụ na-etinye akwụkwọ nri
- Ụfọdụ na-etinyekwa mkpụrụ ọka
- Ụfọdụ na-etinyekwa ogiri

Etu esi esi ya
Ihe ndị a ka ị ga-eme tupu i sie ụkwa gị:
- Saa ụkwa gị mmiri ọfụma iji hụ na aja maọbụ kịrịkịrị okwute adịghị ya n'ime.
- Wunye ya n'ime ite tụmadụ nke bekee kpọrọ 'pressure pot' ma wunyekwa ya mmiri ga-ekpuchi ya ọfụma
- Ụfọdụ na-etinye akanwụ maọbụ ngọ iji mee ka o dee ma ghee ọsịsọ
- O ghewe nakwa mmiri dị n'ime ya tawa, tinye ya ose akwọrọ akwọ, mmanụ nri na nnu
- Hapụ ya ka ya na ngwa nri ndị ị tinyere n'ime ya sụkọta ọnụ
- Kpagharịa ya ma hapụzịa ya ka ọ nọrọ n'ọkụ dee ede ma ghee ọfụma

Etu esi eri ya
A bịa n'ụfọdụ obodo dịka Urualla dị n'Imo steeti, ha anaghị azapụ mmiri e ji sie ụkwa ha. Ha na-aṅụ mmiri ya iche ma riekwa ụkwa ha iche.
Ụfọdụ anaghị etinye mmanụ nri n'ime n'ụkwa ha, ebe ụfọdụ na-ahapụ mmiri ụkwa n'ime ya nke bụ na ha kuru ya ha ekuru ya na mmiri.
A na-eghekwa mkpụrụ ụkwa eghe, jiri akị etiri eti maọbụ akị bekee taa ya.

Etu esi echekwa ụkwa
A na-agba ụkwa n'anwụ ka ọ kpọọ tupu a gbaa ya n'akpa maka ndị ga-azụta ya iji aga ala bekee.
Tupu ị sie nke kpọrọ akpọ, banye ya na mmiri site n'abalị ruo mgbe chi foro n'ụtụtụ. Nke a ga-eme ka o nwee ike dee ọfụma ma ghee ọsịsọ mgbe ị ga-esi ya.
Ihe ọ na-enye n'ahụ
Nchọpụta ndị ọkachamara sayensị chọpụtara gosiri na ụkwa nwere ọtụtụ ihe ndị dị mma n'ahụ, dịka riboflavin, iron, niacin, thiamin, iron na fosforụs. O nwekwara potassịọm, kọpa, iron, magnizịọm, kalshịọm, zịnkị, manganeezi, selenịụm nakwa fosforụs na vitamin C.
Ọ dị mma maka mkpụrụ obi mmadụ. Ụfọdụ na-eji akwụkwọ osisi ya asacha isi maka ọ na-egbu igu isi nke bekee kpọrọ dandruff, na-akwụsịkwa ndapụsị ntutu.
O nwekwara obere abụba kpụkọrọ ọnụ nke bekee kpọrọ saturated fats, kọlesterọl nakwa sodịọm.

Ihe ndị ọzọ eji ya eme ị na-amaghị
- A na-etinye ụkwa n'ime ụfọdụ mmanụ na-aba n'anya iji nye ya ụtọ (flavour)
- A na-akwọ mkpụrụ ụkwa akwọ jiri ya mee ihe Bekee kpọrọ flour
- A na-apịpụtakwa ya mmanụ

Akụkọ ndị ga-amasị gị:

Ihe nkiri a ga-amasị gị:










