Ndị ụka katọlịk emeela ngagharị maka etu nchekwa ndụ si jọọ njọ na Naijirịa

Ndị ụka Katọlịkị emeela ngagharị ekpere n'ụbọchị Sọnde n'Abuja ị jị gwa gọọmentị etiti na-afọ ejughị ha etu ha sị echekwa ndụ ndị mmadụ.
Ndị mere ngagharị iwe a gụnyere John Cardinal Onaiyekan, nakwa ndị Bishọp ụka katọlik niile.

Ọ bụ nzụkọ ndị Bishọp haziri ya bụ ngagharị.
Ha yikwa akwa ojii iji gosi na ha na-eri ụjụ maka etu nchekwa siri dobe isi na Naijirịa.
Ndị nzụkọ a rụtụkwara aka maka ndị ụkochụkwụ atọrọ atọrọ ma ndị nke egburu egbu.
Platu steeti

Ebe foto si, Getty Images
Kọmishọna na-ahu maka ahụike na Plateau steeti bụ Dr Lar Ndan ekwuola na ndị Chaina anọ ha dopụrụ iche enweghị ọria Coronavirus.
O kwuru nke a mgbe BBC gbara ya ajụjụ ọnụ ma sịkwa na ọ bụ n'ụbọchi iri maọbụ iri na otu ka ha ga-ahapụ ha.
Man City eturula ugo

Ebe foto si, Getty Images
Ndị otu egwu bọọlụ Manchester City amaburula iko Carabao Cup nke afọ 2020.
Nke a bụ afọ nke atọ ha na-amaburu iko a na-enweghị onye mara ha aka.
Ọkpụ goolu abụọ a satara otu ka ha ji merir ndị Aston Villa iji turu ya bụ ugo.
Ihedioha ka na-aga ụlọikpe

Ebe foto si, @emekaihedioha/Instagram
Emeka Ihedioha ekwuola na arịrịọ ọ na-arịọ ụlọikpe ọkachasị maka mkpebi ha banyere ntuliaka Imo abughị otu ihe na nke Bayelsa
Ihedioha sị na ya anaghị asị ka ụlọikpe kpee onwe ha ikpe kama ya chọrọ ka ewezụga mkpebi ha.
Ihe ise gbara ọkpụrụkpụ na ikpe bụ kpedidere Ihedioha;
- Na ndị okaiwu Hope Uzodinma gbara akwụkwọ gosipụtara akwụkwọ nke ha jiri gosi mpụta n'ọgbọ atụmvootu dị narị atọ iri isii na isii n'Imo steeti.
- Ndị okaiwu Emeka Ihedioha egosighị ihe igba ama ga-egosi na akwụkwọ mpụta ntụliaka ndị okaiwu Hope Uzodinma ji bụ "adigboroja" dịka ha siri kwuo.
- Akwụkwọ ndị uweojii nke gosiri mpụta ntụliaka na ọgbọ 366 ndịa gosiri na nke ndị Okaiwu Hope Uzodinma jị bụ eziokwu.
- Ndị Inec eweteghị ihe igbaama ga-egosi na akwụkwọ ọkaiwu Uzodinma ji abụghị nke ezigbo ya.
- Ụlọikpe Kachasi sitere n'ikike iwu Naijirịa nyere ha were nye Hope Uzodinma ọchịchị Gọvanọ Imo steeti n'ihi na Ọkaiwu Emeka Ihedioha na ndị Inec enweghị ihe Igba ama gosiri na ikpe Hope Uzodinma gbara enweghi isi.
Ihedioha na-arịọ ka ewsuga nke a.
Na nke Bayelsa ụlọikpe kpebiri na onye zọrọ ọchịchị dịka osote Gọvanọ Bayelsa n'okpuru patị All Progressives Congress (APC) bụ Biobarakuma Degi-Eremieoyo etozughi ịzo ọchịchi.
Ndị Ọkaikpe nke Mary Odili no n'isi ha sị na nkagbu njem Degi-Emeriewoyo metụtara vootu David Lyon jiri pụta dịka gọvanọ Bayelsa nke mere na ya onwe ya etuzughi.
Ha sị na ọchịchị ga-efezi n'aka Douye Diri nke PDP.
Lyon na APC gaghachiri ụlọikpe kachasị, mana Ọkaikpe gbarụrụ ihu maka atụmatụ a na ndị ọkaiwu bịara ya bụ ije nde naịra atọ.
Obasanjo sị na ekwesiri ịge ntị n'Atụmatụ 'Restructuring'

Ebe foto si, Getty Images
Onye bụbụ onyeisiala Naịjirịa bu Olusegun Obasanjo adụọla Onyeisiala Muhammadu Buhari ọdụ maka ịgbajọ atụmatụ ikewa Naịjirịa n'usoro akpọro "Restructturing"
Obasanjo si na ọ dị mkpa ka Buhari gee ntị okwu a naekwu maka atụmatụ a iji gbanarụ nsogbu nwereike gunyere agha.
Onye bụbụ onyeisiala Amerịka bụ Joe Biden enwetela mmeri mbụ na njem ya ị bụ onye ga-eburu ọkọlọtọ patị Demokrat zụọ ọkwa onyeisiala mba Amerịka.
Ọ bụ Bernie Sanders no n'ihu ndọrọndọro a mana oge a na-ele anya na ọ bụ n'ụbọchị akpọrọ "Super Tuesday" ka a ga-ama onye bu oke na mbe ndị fọro n'ọgbọ.
N'egwuregwu,

Ebe foto si, Getty Images
Agbanyeghi na Tyson Fury meriri ya na ọkpọ ya pịara n'izuụka gara aga Deontay Wilder achiela aka ka ha zụte ọzọ.
Mmadụ abụọ ga-ezute ịku ọkpọ nke atọ ha n'afọ a.
A matala mmadụ 100 n'ime ndị zutere nwoke bubatara nje coronavirus

Ebe foto si, @FAAN_Official
Kọmịshiona na-ahụ maka ahuike na Legọs ekwuola na ha ewepula onye mba Ịtali bu nje coronavirus bata Naịjirịa gawa ebe ọ ga-anata ọgwụgwọ ọka mma.
Ọ sịkwa na ya bụ nwoke na-agbake.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 1
N'otu aka ahụ, a na-enyocha mmadụ atọ ọzọ si Chaịna gawa ọrụ na platu steeti ka amara ma ya bụ nje ọ dị ha na-ahụ.
Nke a na-abịa ka steeti Ogun kwuru na ha amatala mmadụ narị ha na nwaamadị ahụ si Ịtalị bị zutere, ma sikwa na ndị nọ na "Quarantine" dị mmadụ iri atọ na itoolu.
Ngalaba na-ahụ maka njem n'ọdọ ụgbọelu Naịjirịa bụ nke Bekee kpọrọ "Federal Airports Authority of Nigeria" (FAAN) gosikwara etu ha siri dịrị njikere maka nyocha nje coronavirus.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 2
Ndị mmadụ na-eto kwanụ ha etu ha si agba mbọ, ọkachasị etu ha ji eme karịa ọtụtụ mba ndi ọzọ.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 3











