Supreme Court Judgement: Ihedioha agaghachịla ịkpegharị ikpe oche ya na Hope Uzodinma

Ebe foto si, @emekaihedioha/Instagram
Emeka Ihedioha agaghachila n'ụlọikpe kachasị ịgwa ha ka ha lebaa anya ọzọ n'ikpe ha kpere nke chuturu ya dịka gọvanọ Imo State.
Ihedioha na-ekwu na ọ bụ nghọgbu ka Hope Uzodimma ghọgburu ndị "Supreme Court" mere ha ji kwenye na ọ bụ ya meriri ntuliaka gọvanọ Imo steeti e mere na 2019.
Igbo ga-adị n'Anambra steeti

Ebe foto si, Getty Images
Gọọmentị Anambara steeti amachiela ịta ụmụakwụkwọ praịmarị nakwa sekọndịrị ahụhụ maọbụ iri ha iwu maka ịsụ Igbo n'ụlọakwụkwọ ha.
Damian Okeke-Ogene bụ onyeisi Ohaneze Ndigbo nke Anambara steeti kwuru na atụmatụ ahụ magburu onwe ya ma rịọ ka nkuzi Igbo siwanye ike n'ụlọakwụkwọ dị icheiche.
Iwu a metụtara ụlọakwụkwọ pramarị nakwa ndị sekọndrị niile dị na steeti ahụ.
Na mba ofesi,
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 1
Onye dọkịta mbụ buru ụzọ gbaa ama maka ọrịa cọrọnavirus na mba Chaịna alaala mmụọ dịka o butekwara ya bụ ọrịa.
Dọkịta a aha ya bụ Li Wenliang gbara ama ọrịa coronavirus n'ọnwa Disemba 2019 mana ndị uweojii mba ahụ sị ya mechie ọnụ na ọ maghị ihe ọ na-ekwu.
N'egwuregwu,
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 2
Otu egwu bọọlụ Real Madrid nakwa Barcelona akwarala laa n'asọmpi Copa Del Rey dịka e mriri ha abụọ n'abalị Tọzde.
Real Sociedad ji ọkpụ goolu anọ asatara atọ merie Madrid ebe Athletico Bilbao ji otu ọkpụ goolu gbalaa ndị Barca.
Gee akụkọ ụwa n'ime otu nkeji ebe a









