Imo State: "Ihedioha kwado ịga mkpọrọ" - Fada Mbaka

Ụkọchukwu Ejike Mbaka

Ebe foto si, Facebook/Adoration Ministry Enugu Nigeria

Nkọwa foto, Ụkọchukwu Ejike Mbaka

Ụkọchukwu na-elekọta Adọration Mịnịstrị n'Enugwu bụ Fada Ejike Mbaka ewerela olu ike baara gọvanọ Imo steeti pụrụ apụ bụ Emeka Ihedioha mba.

Mbaka gwara Ihedioha ka ọ kpachara anya ya na 'ganị ganị' niile ọ na-akpọ kemgbe a chụpụrụ ya n'oche, ma ọ bụrụ na ọ chọghị iga ụlọ mkpọrọ.

Ụkọchukwu ahu kwuru na afọ juru ya nke ukwuu etu ụlọikpe kachasị si kpee ikpe Ihedioha na Hope Uzodinma bụ onye nọchiri ya dịka gọvanọ ugbua.

Ọnụokwu Mbaka

Aha onyonyo, Imo state: "Ihedioha nwere ike ịga mkpọrọ ma ọ kpachaghị anya" - Mbaka

Ọ gwakwara ndị mmadụ ka ha kwụsị ịgbagha maọbụ na-ekwu okwu ọjọọ maka amụma ya niile.

Cheta na Emeka Ihedioha gwara BBC Igbo na mkaprịtaụka, na a gbawara ndị Imo Steeti aka napụ ha ọchịchị.

Aha onyonyo, Imo State Election: Agbawara ndị Imo Steeti aka napụ ha ọchịchị

Mbaka jikwa ohere ahụ tinye ọnụ n'okwu gbasara ndị ụkọchukwu ibe ya na soshal midia.

Ọ kwara arịrị na ndị ụkọchukwu ibe ya bụzị ndị na-agba ya mgba ugbua na soshal midia.

Aha onyonyo, 'Amụma Fada Mbaka buru maka Hope Uzodinma n'Imo na-eme ihere'

O kwuru na ọ bụ ihe ihere dịịrị onye ọbụla tinyere ọnụ na-akatọ ya n'ụdị ọbụla.

Mbaka gwara ndị fada ibe ya nakwa ndị nkịtị, ka ha ghọta na onyinye dị iche iche.

"N'ihi ya, onye ọbụla ekwesịghị inwere m anya ụfụ n'ihi na amụma m na-emezu oge niile," ka o kwuru.

Akụkọ ga-amasị gị:

Ihe nkiri a ga-amasị gị:

Aha onyonyo, Jụọ ndị na-achị gị ihe ha ji akụnaụba ọha mee - Charly Boy