Imo State: A gbawara ndị Imo Steeti aka napụ ha ọchịchị - Emeka Ihedioha

Aha onyonyo, Imo State Election: Agbawara ndị Imo Steeti aka napụ ha ọchịchị

Emeka Ihedioha ụlọikpe chụpụrụ n'oche gọvanọ Imo steeti, gwara BBC Igbo na mgbe e kpechara ikpe a na ọ nabataghị ya, mana o nweghi ihe ọ ga-emenwu maka na ọ bụ ụlọikpe kachasị kpere ya bụ ikpe.

Kama na ya na ndị ọkaiwu ya nyochara ikpe ahụ ma chọpụta na o dị ka o nwere ohere ịlaghachị ka ndị ọkaikpe lebagharịa anya n'ikpe ha kpere.

Nke a bụ maka na ebe ha gbakwasịrị ụkwụ kpee ikpe a nwere ihe na-edoghi anya n'ime ya.

O kwukwara na mgbe e mere ntuliaka ma kpọpụta ya dịka onye meriri, na o nweghi mgbe e kwuru na o nwere ọdọ ebe a na-atụ vootu dị 388 ha jiri tụkwasị n'elu vootu Hope Uzodinma.

Mgbe a jụrụ ya maka ngagharịiwe ndị PDP na-eme maka ikpe a, Ihedioha sị na ọ bụghị ya gwara ndị PDP mee ngagharịiwe.

Ọ gakwara n'ihu kwuo na ọ bụghị naanị ndị PDP mere ngagharịiwe, kama na ndị mmadụ maara na ikpe e kpere ezighi ezi.

Ihedioha natara asambodo mmeri n'aka Inec n'Imo

Ebe foto si, Ihedioha/Twitter

N'ajụjụ ihe mere o ji dịka o ji aka ike achụ Rochas Okorocha bụ onye ọ natara ọchịchị, o kwuru na ihe o mere bụ ihibe kọmitii ga-ahụ maka iweghachịta akụnaụba ndị Imo Steeti a kpachiri akpachi.

Na ihe o mere bụ ihe ndị Imo Steeti chọrọ n'aka ya, na ọ dịghị mma otu onye ikpachikọ akụnaụba gọọmentị bụ nke ọha nwe.

Ihedioha gara n'ihu kọwapụta ọtụtụ ihe ndị ọ rụpụtara n'Imo Steeti n'ime ọnwa asaa ọ nọrọ n'ọchịchị.

Mana mgbe BBC Igbo gbara Okorocha ajụjụ banyere etu Ihedioha si akpaso ya agwa, ọ sị na ọ bụghi akụnaụba Imo Steeti mere ya onye ọ bụ. Na ọ kpatachaala ego tupu ọ bụrụ gọvanọ.

Na gọọmentị Ihedioha na-akpa agwa ka ụmụaka kama na ihe mere o jiri gba nkịtị bụ maka na ọ chọrọ udo n'Imo Steeti.

Okorocha gara n'ihu kwuo na ọnọdụ ya n'ime Steeti ahụ dịka nke ọnọdụ onye nna n'ime ezinaụlọ bụ onye na-eme udo n'oge niile.

Kirie nke a n'uju.

Akụkọ ndị a ga-amasị gị:

Ihe nkiri a ga-amasị gị:

Aha onyonyo, Rochas Okorocha: Ọ bụrụ na asị m pụọ na Senate ka Naịjirịa dị mma, aga m apụ