Fire Outbreak: Ụlọọrụ Inec agbaala ọkụ n'Ọrlu dị n'Imo Steeti

Ndị a na-amatabeghi ndị ha bụ agbala ụlọọrụ Inec dị n'okpuruọchịchị Orlu nke Imo steeti ọkụ n'isi ụtụtụ ụbọchị Mọnde 3, Febụwarị 2020.
Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii Imo steeti bụ Orlando Ikeokwu gwara BBC Igbo na nke a bụ eziokwu.
Ọ sị na onweghi onye merụrụ ahụ mana ndị uweojii ka na-eme nyocha ịchọpụta etu ọkụ a ji malite.

Ebe foto si, Imo Police
Akụkọ gara n'ihu kwuo na ọtụtụ ngwaọrụ ndị ụlọọrụ Inec sọ na ihe ndị gbara ọkụ.
Ihe a bụghị nke mbụ a na-awakpo otu ụlọọrụ a na nso nso a. Na ntuliaka afọ 2019 ndị ekperima wakporo ụlọọrụ ma bukọrọ ngwaọrụ dị n'ime ya.
Nzukọ Buhari na ndị isi ụlọomeiwu

Ebe foto si, Bashir Ahmad/Twitter
Onyeisiala Buhari na ndị isi ụlọomeiwu bụ Ahmed Lawan na Femi Gbajabiamila nwere nzukọ taa nke a na-amabeghi ihe bụ isi nzukọ ha.
Mana kepu kepu na-ekwu na ha gara igwa Buhari nyocha ha metara banyere ọnọdụ nchekwa na Naịjirịa.
Onweghi nwafọ Naịjirịa bu Coronavirus

Ebe foto si, Getty Images
Onye na-anọchiteanya mba Chaịna na Naịjirịa bụ Zhou Pingjian sị na onweghi nwafọ Naịjirịa ọbụla bi na Chaịna bu ọrịa coronavirus.
Pingjian sị ndị Naịjirịa bi n'obodo ebe ọrịa a malitere dị iri isii.
N'egwuregwu

Ebe foto si, Getty Images
Neymar na-agbara PSG bọọlụ haziri oriri iji cheta ụbọchị ọmụmụ ya mana onye nchịkọta ha bụ Thomas Tuchel ekweghi aza oku Neymar kpọrọ ya.
Tuchel sị na oriri a bụ mmegharị anya nye ya dịka ha nwere asọmpi n'abalị abụọ na-abịa.
Gere akụkọ BBC Igbo n'otu nkeji
Ihe nkiri a gbasara Fada Ebube Mmụọnsọ ga-amasị gị:
BBC World Service na-eme nrụrịtaụka nke a kpọrọ 'BBC World Questions'

Ebe foto si, Twitter/Joe Igbokwe, Aisha Yesufu, Osita Chidoka
BBC World Service na-eme nrụrịtaụka nke a kpọrọ 'BBC World Questions' na mpaghara mbaụwa niile gụnyere Naịjiria.
N'atụmatụ a, ndị mmadụ ga-enwe ohere ịjụ ndị ndọrọndọrọ ọchịchị, ndị isi nakwa ndị ọnụ na-eru n'okwu ajụjụ ihu na ihu.
Ọ bụ site n'ihe ndị mmadụ jụrụ ka ndị a kpọtara ga-esi kpaa nkata.
Onyeisi BBC na Naịjirịa bụ Toyosi Ogunseye na ndị ọnụ na-eru n'okwu bụ Hadiza Bala Usman (onyeisi ụlọorụ Nigerian Ports Authority), Osita Chidoka bụbụ minista na-ahụ maka njem ụgbọelu, Joe Igbokwe bụ ọnụ na-ekwuchitere APC na Legọs steeti na Aisha Yesufu bụ onye na-ahụ maka ikike dịrị onye, ga-eso eme nrụrịtaụka a.
Ndị ụlọorụ British Council na-akwado BBC ịhụ na ụbọchị ahụ gara nke ọma.
A ga-eme emume a n'elekere isii nke mgbede, n'ụbọchị anọ nke ọnwa Febrụwarị 2020, na MUSON Centre dị na Legọs steeti.
Ọ bụrụ na ị chọrọ isonye n'emume a? Pịa aka n'akara a www.britishcouncil.org.ng/events/bbc-world-questions-lagos
Mmachi keke na-enye ndị Legọs nsogbu
Ndị bi na Legọs na-etisi mkpu ike na-akwa akwa arịrị maka ụdịrị ahụhụ ha na-ata kemgbe gọọmentị steeti ahụ machiri ndị ọkada na keke ịgba n'ụfọdụ ụzọ.

Ndị mmadụ, ọtụtụ bụ ndị pụtara n'ụzọụtụtụ ịchọ etu ha ga-esi aga mkpa ha n'ụtụtụ a, ka kwụ n'ụzọ na-eche ka ụgbọala rute ha, ebe ndị ọzọ ejirila ụkwụ gaa ogologo ụzọ.
Ọgụ achaala n'etiti ndị uweojii na ndị ọkada na keke na mpaghara Ijora dị na Legọs.

Akụkọ si ebe ahụ eru anyị ntị na-akọwa na a na-akwa mgbọ ebe ahụ, dịka ndị mmadụ na-agbakwa taya ọkụ n'ụzọ.
Chaịna na-atụ Amerịka aka ọjọọ

Ebe foto si, Getty Images
Gọọmentị mba Chaịna ebola mba Amerịka ebubo itinye ndị mmadụ oke ụjọ na obi mmapụ n'ahụ site n'etu ha si ekwuputa maka ọrịa Coronavirus.
Nke a na-abịa dịka mba Amerịka kwuru na ha agaghị ekwe ndị mba ha gara Chaịna n'ime izu abụọ kemgbe ọrịa a nyewere ezigbo nsogbu, bata.
Nzọgbu nzọgbu Enyimba enyi!
Otu egwuregwu Enyimba zọgburu enyi ndị FC San Pedro nke mba Aịvorị Kost iji wụbanye n'agba mgbapụ nke asọmpi CAF Confederations Cup.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 1
Enyimba ruru agba ọkara-ikpeazụ tupu a gbapụ ha n'asọmpi a n'afọ 2018, ji goolu ise asatara naanị abụọ merie.
China arụọla ụlọọgwụ ọhụrụ n'ime otu izu

Ebe foto si, EPA
Nwanne biko tuo Chaịna 'ekwu eme'!!!
Ị ma na ha arụchaala ụlọọgwụ ọhụrụ ahụ ha malitere ịrụ n'izu gara aga maka ilekọta ndị mba ha bu ọrịa Coronavirus?
A ga-emepe ụlọọgwụ ahụ nwere akwa otu puku n'oge adịghị anya, dịka ndị na-arụ ebe ahụ ga-abụ ndịagha na-ahụ maka ahụike.
Ụlọọgwụ ahụ ha kpọrọ "Huoshenshan Hospital", dị n'obodo Wuhan bụ ebe ọrịa Coronavirus a malitere.
Mara na ọrịa a egbuola mmadụ 361 na mba Chaịna, ebe ihe karịrị mmadụ puku 17 ka bu ya bụ ọrịa.
Ozi ndị Chaịna ziputara n'ụtụtụ a gosiri na a gwọtara mmadụ 475 bubu ọrịa a, ebe a ka na-enyocha mmadụ 152,700.
Maka ọnwụ osote onyeisi NADECO
Onyeisiala Muhammadu Buhari etiela ezinaụlọ Arthur Nwankwo bụbụ osote onyeisi otu National Democratic Coalition (NADECO) nakwa ndị Anambara steeti aka n'obi n'ihi ọnwụ ya.
Content is not available
View content on FacebookBBC anaghị ahụta maka ọdịnaya nke saịtị ndị dị na mpụga.sEnd of Facebook post
Nwankwo bụ odeakwụkwọ dere akwụkwọ ndị gụnyere Danda, My Mercedes is Bigger than yours, nakwa Tales out of school.
A kpụ Boko Haram n'ọnụ ọzọ
Boko Haram na-ewu na soshal midia ugbua dịka ndị Naịjiria na-ajụ ajụjụ ịmata ihe mere gọomentị Naịjirịa ji gbaghara ihe karịrị mmadụ iri asatọ n'ime ha.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 2
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 3
Nke a na-abịa dịka e jidere otu onye a na-enyo na ọ bụ onye Boko Haram ji ogbunigwe ga n'ụlọụka dị na Kaduna steeti.
Super Bowl nke mba Amerịka
Ihe na-ewu ugbua n'ụwa egwuregwu bụ mmeri Kansas City Chiefs meriri San Francisco 49ers n'asọmpi Super Bowl nke bọọlụ mba Amerịka.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 4
Mmeri a mere ya mbụ ndị Chiefs na-emeri na Super Bowl n'ime afọ iri ise.
Gere akụkọ BBC Igbo n'otu nkeji
Ihe nkiri a ga-amasị gị:











