#BBCGovDebate: Nrụrịtaụka BBC Igbo niile abịala na njedebe
Ihe ndị dị mkpa mere taa

Nrụrịtaụka ọkwa gọvanọ nke BBC Igbo hibere emechiela taa dịka emere nke Ebonyi steeti n'ehihie ụbọchị Sunde.
Cheta na nrụrịtaụka a malitere na Imo steeti metụtakwara Abịa steeti dịka Igwe mmadụ pụtara ịjụ ndị ọchịchị ajụjụ dị ha mkpa.
Ọzọ,
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post
Onyeisi ụlọụka Redeemed na Naịjirịa bụ Pastor EA Adeboye emerela osote onyeisiala Naịjirịa bụ Yemi Osinbajo ụka mmamma n'ụbọchị sunda
Nke a bụ maka ụgbọelụ helịkọpta bu ya dara n'obodo Kabba na Kogi steeti n'ehihe satọde.
Na mba ofesi,

Ebe foto si, Reuters
Ụfọdụ ụmụnwanne ndị nọ n'ụlọ mkpọrọ dị n'obodo New York emeela ngagharịwe maka ọnọdụ esi debe ụmụnwanne ha na mba Amerịka
Iwe ha bụ na oyi na-atụgbu ụmụnwanne ha dịka ha enweghi ọkụ latrik maọbụ mkpoọkụ n'oge oke oyi a na mba ahụ.
N'egwuregwu,

Ebe foto si, Getty Images
Mmeri otu Manchester United meriri otu Leicester city na mgbede sunde ga-eme ya mmerị itoolu n'ime asọmpị iri otu Man U riterela n'okpuru onye ndu ọhụrụ ha bụ Ole Gunner Solskjaer.
Ọ bụ Marcus Rashford nyere ọkpụ goolu ha jiri dọka neetị ndị Leicester
Akụkọ BBC Igbo na nkeji
Akụkọ dị mkpa n'ụtụtụ

Ndọrịtaụka nke BBC haziri maka ndị na-azọ ọkwa gọvanọ jisike aga n'ihu ugbua.
Taa ọ ga-akpọtụ n'Ebonyi steeti ebe ndị na-azọ ọkwa gọvanọ na steeti ahụ ga-enwe ndọrịtaụka gbasara etu ọchịchị ha ga-esi bara ndị steeti ahụ uru.
Gọvanọ na-achị Ebonyi steeti ugbua bụ Dave Umahi ma bụrụkwa onye otU PDP so na ndị ga-eme ndọrịtaụka a.
Ndị ọzọ ga-eso gụnyere Nnaji Igbokwe onye otu pati Accord nakwa Ogbonnaya Okorie bụ onye otu Advanced Allied Party.
BBC Igbo ga-ewetere unu ka o sị aga mgbe a ga-amalite ya bụ ndọrịtaụka taa.
N'akụkọ ọzọ,
Inec etiela aka n'obi

Ebe foto si, AFP
Dịka ntuliaka nke afọ a na-akpụkete nso, ụlọọrụ na-ahụ maka ntuliaka akpọrọ INEC n'ichafụ ekwuola na ha adịla njikere ịme atụmaatụ a.
Onyeisioche ngalaba na-ahụ maka mgbasa ozi na Inec bụ Festus Okoye kwuru na ha ebugala ngwa ọrụ a ga-eji mee ya bụ ntuliaka n'ụlọakụ ukwu bụ Central Bank of Naịjirịa ebe a ga-esi bụga ya ebe ndị a
ga-eme ntulaiaka n'abali ga-efopụta ụbọchị ntuliaka.
N'ofesi,

Ebe foto si, AFP
Enwela nkwekọrịta udo n'etiti otu nnupuisi ruru iri na anọ na gọọmenti etiti Central African Repọblịk ka enwechara mkparịtaụka na mba Sudan.
Ọ bụ ndị ozi United Nations nọ na CAR akpọrọ Minusca nakwa Africa union bụ ndị kwadoro ya bụ mkparịtaụka kwuputere nke a.
N'egwuregwu,

Ebe foto si, Getty Images
Chelsea ji ọkpụ goolụ ise asataghị otu merie Huddersfield, TottenHam tikwara Newscastle otu ọkpụ goolu asataghị otu, Cystal Palace jikwa ọkpụ goolu abụọ asataghị otu wee merie Fulham ebe Wolves tiri
Everton mmanwụ site n'inye ha ọkpụ goolu atọ asatara otu n'asọmpị Premiere League ụbọchị Satọde gara aga.
Nkeji taa
Ihe nkiri taa











