Abia sate election: Ndọrịtaụka a ga-enye aka ịkwalite ọchịchị onyekwuoucheya - Ndị Abịa
Nrụrịtaụka BBC Igbo n'Abia abịala na njedebe.
Ndị Abịa kwuru na ndọrịtaụka ahụ nke BBC Igbo haziri n'Ụmụahịa, Abia steeti ga-enyere ọchịchị onyekwuouche ya aka na steeti ahụ.
Lee ụfọdụ ihe ekwuru i kwesiri ịma:
ALEX OTI (APGA)

- A ga m eleba anya na-etu steeti Abịa siri jide ụgwọ karịrị otu narị ijeri naịra
- A ga m akwụ N36,000 dịka ụgwọ ọnwa opekatampe
- A ga m arụ ụzọ, wulite mmepụta ọkụ Latrịk, ma kpochaa Aba ka ọ dị ọcha
- A ga m eme ka enwee ezi mkparịtaụka dị n'etiti gọọmenti nakwa otu IPOB iji gboo nsogbu ha.
BLESSING NWAGBA (SDP)

- A ga m akwụ N50,000 dịka ụgwọ ọnwa opekatampe
- A ga m ahazigharị ọnọdụ ndịọrụ i ji mee ka ha rụsie ọrụ ike
- A ga m arụgharị ụzọ dị n'Aba iji kwalite mbawanye ụlọọrụ
- A ga m etinye n'ọrụ, iwu ndị ahụ ewepụtara maka ọdịmma ndị ọrụsị.
JOSEPH NKORO (YPP)

- A ga m e ji unyi maọbụ ureghure nọ 'Aba nweta ikike ọkụ
- A ga m ekewapụta ogbe obibi ọgbaraọhụrụ n'ime ọgbọnta vootu atọ na steeti Abịa
- A ga m ekewapụta ụlọọrụ na-ahụ maka ọrụ ndị dị mkpa iji nyere ndị ọrụsị aka
- A ga m ekewapụta ụlọakwụkwọ ga na-ahụ maka ọzụzụ akaọrụ nakwa ọrụugbo iji nye ndị ntorobịa ọrụ.
CHUKWUEMEKA UWAKOLAM (ACCORD)

- A ga m akwụ N30,000 nakwa ego mkpọnye aka ndị ọzọ nye ndịọrụ n'oge
- A ga m arụzigharị okporoụzọ Aba iji mee ka ọnọdụ akụnaụba tụtegharịa
- A ga m etinye n'ọrụ, ego mmanụ niile batara na steeti Abịa iji mee ka ndị mmadụ kute ume ndụ
- A ga m atụtegharị ọnọdụ egwuregwu.








