2019 Elections: Gịnị mere ndị ndọrọndọrọ ji agbahapụ nrụrịta ụka

Site na nrụrịtaụka nke BBC Igbo hibere ma rue nke ọgbakọ mgbasaozi Naịjirịa bụ BON n'aha ịchafụ hibere maka ọkwa onyeisiala, ndị ndọrọndọrọ agbahapụla ụfọdụ nrụrịtaụka.
N'ime mmadụ anọ nke ndị BBC Igbo kpọrọ oku maka nrụrịtaụka ọkwa gọvanọ n'Imo steeti, sọsọ otu onye pụtara.
N'otu aka ahụ, onyeisiala Muhammadu Buhari nakwa Atiku Abubakar nke na-azọ ọkwa onyeisiala gbahapụrụ nrụrịtaụka nke BON haziri maka ha na ibe ha.
Nrụtịtaụka bụ ohere ndị na-azọ ọchịchị kwesiri ị ji gosi ihe ha bụ n'uche banyere ndị ha na-achọ ịchị nakwa zaa ajụjụ ọbụla ha nwere.
Mana kedu ihe mere ụfọdụ ndị ndọrọndọrọ ọchịchị ejighi ekwe egosi ihu ha n'ebe ọ dị mkpa?
Otu onye ọnụ na-eru n'okwu n'ihe gbasara ndọrọndọrọ ọchịchị bụ Nicholas Ibekwe akụwala akụoyibo nsugbe gbasara ya bụ owku.
Ọ sị na ụfọdụ oge, ndị ndọrọndọrọ akpọghị nrụrịtaụka ihe dị mkpa n'ihi na-onweghi ihe uru ha na-erite na ya.
Ihe ọzọ Ibekwe kwuru bụ na ọtụtụ ụmụ Naịjirịa enweghi akọ na uche ị ghọta ihe omimi dị na ndọrọndọrọ ọchịchị.
N'uche ya, nke a ga-eme ka ha ghara iji nrụrịtaụka ọbụla kpọrọ ihe ma mekwaa ka ndị ndọrọndọrọ gbalahụ ya n'ihi ahụghị mmadụ.
BBC gbara mbọ ịnụta n'ọnụ ndị a gbajoro nrụrịta ụka mana ha asaghị ekwenti ha.
Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị










