Obasanjo: 'Anyị chọrọ onyeisiala isi na ahụ zuruoke'

Ebe foto si, Getty Images
Olusegun Obasanjo ekwuola na o cheghị na Inec ga-eme ntụliaka kwụ ọtọ n'ọnwa na-abịanụ.
"Ọ bụrụgodi na ha chọrọ ime ntuliaka kwụọtọ, ndị nọ n'ọchịchị ugbua agaghị enye ha ohere."
Obasanjo kwuru nke a mgbe ọ na-agụpụtara ndị ntakụkọ akwụkwọ o depụtara akpọrọ "Points for concern and action" n'ụlọ ebe o na-edowe akwụkwọ na Abeokuta.
O kwuru na ihe Naịjirịa chọrọ ugbua bụ onyeisiala nwere uche zuruoke ma sikwa ike ichi obodo.
Obasanjo kwuru ka ụmụ Naịjirịa too obere ihe Buhari meere ha kamgbe ọ nọ n'ọchịchị.
N'okwu ya, "Buhari alafu go anyị na mbụ, anyị ga-abụ ewu maọbụru na anyị kwe ka ọ rafuo anyị ọzọ."
O were ọchịchị Buhari tunyere nke onye agha ji aka ike chị Naijirịa akpọrọ Sanni Abacha mgbe ọ dị ndụ dịka onyeisiala.
Akụkọ ndị ga-amasị gị:








