Heart Surgery: E mere ya ụmụaka 24 na-akwụghị ụgwọ ọbụla n'UNTH Enugwu.
Otu nne nwa si Port Harcourt bịa bụ Irene Uwandụ, kwuru na nwa ya Bethel Uwandụ nwere oghere n'obi nke ndị oyibo kpọrọ "Hole in the Heart".
Uwandu kwuru na agwara ya weta ego karịrị nde naira ise n'India ka ewere waa nwa ya obi, mana ha enweghị ego ime nkea.
O kwuputara ka aṅụrị sị ju ya obi na nwa ya adịrịla ya ndụ.
Onye nne ọzọ awakwara nwa ya afọ na-akwụghị ụgwọ ọbụla bụ Esther Ejoh kwuru na nwa ya dị afọ iri na abụọ atala ha ahụhụ nke ukwuu nke na ha enweghịzị ego ọbụla ha ji eri nri.


Ejoh toro atụmatụ enyemaka nke UNTH Enugwu.

Onye isi Ụlọ Ọgwụ ahụ bụ Dọkịnta Christopher Amah kọwara na ihe karịrị ụmụ aka iri na asaa bịara n'UNTH ịnweta ọgwụgwọ n'efu mana nanị iri na anọ ka ha mere.
Amah yọrọ enyemaka gọmenti na ndị nwere ego n'Naịjrịa ka ha gbakwute ndị ogbenye ọsọ enyemaka site n'ịkwụrụ ha ụgwọ ma nyekwara UNTH Enugwu aka inwetakwu akatamkpọ akụrụngwa ejị awa obi.

Amah kọwara na ọ bụ otu onye ụkọchukwu katọliki kpọtara ndị dọkinta niile sị aka bekee bịa waa ya bụ obi ebe otu nwoke sị Imo steeti kwụrụ ụgwọ ụlọ ọgwụ ụmụ aka ahụ niile nke mere ejịrị nye ha ọgwụgwọ n'efu.
Akụkọ ga-amasị gị:









