Ihe dara n'ala emetula aja - Obasnajo

Ebe foto si, Getty Images
Olusegun Obasanjo agwala ndị Naịjiria ha chee echiche ọfụma maka ị tịnyere gọọmentị dara ada na ntuliaka nke 2019.
Ọ sị na ha nabata gọọmenti a ọzọ ọ ga-egosi na ndị Naịjirịa na-akwado ihe ojoo ma ọ bụrụ na ha tinye kwa ndị emeghị ka ha sị kwu n'ọkwa ọchịchị ọzọ.
O kwuru ihe ndị a ebe otu ọhụrụ a kpọrọ 'New Nigeria Group' gara ị leta ya n'ụlọ ya.
Obasanjo ji kwa ohere ahụ were bo gọọmentị ndị APC ebubo na ha butere atụmatụ mebiri ahịa, nakwa ahụhụ dị icheiche na ndụ ndị ala Naịjiria.
Okwu ya ebeghị sọsọ n'otu APC, ọ gara n'iru katọ etu PDP sị ndị mmadụ agbaghara maka arịrịọ ha rịọrọ n'izuụka ole nn'ole gara aga.
Obasanjo sị na ọ bụghị otu APC maọbụ PDP ga-ejigide ala Naịjiria ma butekwara ha ọganiru n'udo.
Ọ sị "Ihe anyị chọrọ ụgbụa bụ otu si n'ime igwe mmadụ were pụta, otu ga-ebu ọdịnma ndị mmadụ n'obi".
Obasanjo ji ndụmọdụ mechie okwu ya ọ sị ha nnukwu ọrụ dị mana ha nwere ịke ị mee ihe dị na ya.
Gọọmenti Muhammadu Buhari asabeghị okwu Obasanjo kwuru, mana ha jiri nwayo nwayo sa nke okwubụrụ.
Ihe ndị mmadụ na-ekwu gbasara okwu Obasanjo:
Onye ọkaiwu Festus Keyamo kwuru n'akara tuwịta ya
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 1
Onye Sịnetọ bụ Shehu Sani kwuru uche ya
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 2
Femi Fani-Kayode onye bụbu Minịsta Njem ụgbọelu kwuru nke ya
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 3

Akụkọ ga-amasị gị









