Gọọmentị Buhari enyela Obasanjo ọsịsa edemede o dere

Ebe foto si, Getty Images
Mịnịsta na-ahụ maka mgbasa ozi na Naịjirịa bụ Lai Mohammed asala edemede nke Obasanjo degara Buhari n'ụbọchị abụọ gara aga site na ị gụsị ihe ndị gọọmentị mere n'afọ atọ gaara aga.
Ihe ndị ọ gunyere bụ ibuso mpụ agha, ịkwalite ọkụ latrik, ịtụgharị akụ na ụba ala Naịjirịa na ịweta ọrụ dị iche iche n'obodo .
O kwuru na onwere ike, 'Obasanjo amaghị ịhe niile gọọmenti na-eme n'ihi na o nweghị ohere'.
Abali ole ma ole gara aga onye bụbu onye isi ala bụ Olusegun Obasanjo degara Muhammadu Buhari edemede kwa ya na ikpa oke na etinyeghị uchu na ọrụ emela ka ọghara ime ọfụma na ịkwalite akụ na uba Naijiria.

Ka nke a na-aga, onye na-ekwuchite ọnụ otu nọ n'ọkwa ọchịchị, APC na Lagos bụ Joe Igbokwe gwara BBC na onweghi oge Buhari kwupụtere na ọ ga-azọ ọchịchị onye isi ala na ntụlịaka nke afọ 2019.
"Buharị ga-arụ ọrụ Chineke zigara ya ka ọ rụọ n'isi."
Ọ si kwa na Buhari ga-ejisike ịgba mgba megide mpụ na ezumohi na-aga na Naịjirịa.
Tupu Mohammed zaghachiri edemede nke a, Obasanjo na-ewu n'elu igwe okwu Twita:
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 1

End of X post, 2

End of X post, 3
Ihe butere nke a bụ edemede o degara Buhari na-adọ ya aka na ntị maka ọnwụ ndị mmadụ n'aka ndị ọchị ehi.