Mama Boko Haram: Naịjirịa akwụghị ụgwọ ọbụla iji gbapụta ụmụ Dapchi
Aisha Wakil, nwaanyị Igbo na-alụ onye Ugwu a ma dịka 'Mama Boko Haram' gwara BBC Igbo na o nweghi ego ọbụla Gọọmenti etiti kwụrụ iji gbapụta ụmụaka Dapchi.
Ihe Aisha Wakil kwuru na mkparịtaụka a mere ọnwa ole na ole gara aga kwụnyere n'ihe Lai Mohammed bụ mịnịsịta ọrụ mgbasaozi dị n'aka kwuru.
Na ọsịsa nyocha otu UN mere nsonso a nke kwuru na ego si aka fere aka, Mohammed sị o nweghị ego gọọmenti Naịjirịa kwụrụ maka mgbapụta ụmụ Dapchi.
Lee mkparịtaụka Mama Boko Haram na BBC Igbo nwere:
Akụkọ ga-amasị gị:
Ka amara
E megharịrị atụmatụ ajụju ihe nkịrị a n'ebe ọzọ abụghị ebe emere ya na mbụ.
