Nwunye Kanu: Gọọmenti etiti na-atụ asị

Ebe foto si, Getty Images na BBC
- Onye dere ya, Chioma Nkemdilim
- Ndị mere akụkọ a, Senior Broadcast Journalist, Igbo Service
Nnamdi Kanu bu onyeisi Ipob bụ onye a na-achọ achọ kemgbe September afọ gara aga. Mgbe anyị na nwunye ya bụ Uchechi Kano, na-akpakọrịtara, o kwuru uche ya gbasara ya.
Ihe ndị a bụ ihe o kwuru:
1.Ọ maghị ebe di ya nọ
O kwuru na ya ahubeghi di ya anya, nakwa n'oge ikpeazu ha ji kpakọrịta bụ mgbe ndị agha bịara gbaa egbe n'ụlọ ha dị n'Umuahia oge ha na-eme "Operation Python Dance".
2.O kwuru na ndị gomeentị etịtị ji di ya
O kwuru na ndị gomeenti etiti bụ ndị zitere ndị agha kpọrọ dị ya. N'ihi ya, o kwetere na ha ma ebe ọ nọ. Na ọ bụrụ na ọ dị ndụ na ha bụrụ ya ga Sokoto.
3.O maghị ma ọ dị ndụ ka ọ nwuru anwu
O kwuru na ndị ji Kanu kwuo ebe ọ nọ. Na ọ bụrụ na ọ nwụọla, ha bupụta ozu ya.
4.O kwuru na ndị gọọmenti etiti na-atụ asị
O lotere na mgbe ndị gọọmenti etiti kwuru na ha ejighi di ya, na ha mechara kweta na ọ bụ ha ji ya. Na ndị mere ụdị ihe a, kedu onye ga-ekweta na ihe ha na-ekwu ugbua bụ eziokwu?
5.Lai Mohammed kwuru na ha ejighị di ya
Muhammed kwukwara na onyonyo na-egosi mgbe ndị agha gara n'ụlọ Kanu n'Umuahia bụ adịgboroja. Mana Uchechi Kanu ekweteghi na ihe o kwuru.
6.Ọ dị ya ka ndu ya gba ọtọ maka di ya anọghị ya
Ọ sị na ọ na-ara ya ahụ ilekọta ụmụ ha sọọsọ ya. Na ọ bụ ihe siri ike.
7.Ọ kasiri di ya obi
O kwuru na ihe ga-adị mma.
8.O nweghi uru ọ hụrụ di ya na-erita na njem a ọ nọ na ya
O kwuru na otu o si diri ugbua, ha enweghi ụlọ, na onweghi ihe ha nwere. Ihe ndị di ya nwere mgbe ọ nọ ya bụ ihe ndị mmadụ nyere ya.
9.O kwuru na ndị nọ n'ọchịchị agaghị ekwe ka onye Igbo chịa ala Naịjirịa
O kwuru na ọ bụrụ na ha ga-ekwe ka ndị Igbo chịa, Ojukwu karị imeri mgbe ọ pụtara ịzọ ọchịchị. O kwukwara na ọ bụrụ na ndị gọọmenti etiti ewepụtaghị di ya, na ndị mmadụ agaghị eme ntụlịaka.
10.O kwuru na o nweghi ncheghari gbasara ihe di ya mere
O kwuru na ọ kwụ di ya n'azụ. N'ihe ha na-eme bụ maka ọdịmma na ọganịrụ nke obodo ha bụ Biafra.














