Ndị sineti niile agbakutela Ekweremadu

Ebe foto si, Getty Images
Onye nkwuchiteọnụ osote onyeisi ụlọomeiwu sineti bụ Uche Anichukwu gwara BBC Igbo na ndị ụlọomeiwu sinetị nọ ugbua na be osote onyeisi sineti bụ Ike Ekweremadu.
Anichikwu kwuru na ha gara ikwado ya ma gwaa ya na ha kwụsị ike n'azụ ya.
Nke a bụ na agbanyeghi ihe mere n'ụlọomeiwu sineti taa.
Nke a na gosikwara na ọ bụghị naanị ndị omeiwu otu pati PDP na-akwado Ekweremadu kama ndị otu pati ndị ọzọkwa gụnyere APC.
Ndị omeiwu sineti dị mmadị 109, ọ bụrụ na mmadụ 108 nọ na be Ekweremmadu ugbua, ọ pụtara na ha niile nọ na be ya.
Cheta na ụlọomeiwu sineti kpebiri taa ka ndị ọrụ nchekwa pụọ n'ụlọ osote onyeisi sineeti bụ Ike Ekweremadu ozugbo, ebe ha wakporo taa.
E gbochiri Ekweremadu ịpụta n'ụlọ ya n'ụtụtụ taa, mere ka ọ ghara ịbịa nzukọ ndị ụlọomeiwu ukwu mere taa, ebe ndị omeiwu ruru 14 hapụrụ APC gafee PDP.
Uche Anichukwu bụ ọnụ na-ekwuchitere Ekweremadu, gwara BBC Igbo na ndị EFCC gbochiri ya ịpụ n'ụlọ ya n'Abuja, na ọ bụghị DSS dịka anyị dere mbụ.
@MrBanksOmishore bụ onye enyemaka pụrụiche nke Bukola Saraki, depụtara akwụkwọ ozi ndị EFCC ziteere Ekweremadu n'ụtụtụ a, na Twitter.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 1
N'ime akwụkwọ ozi ahụ, EFCC kwuru na ha chọrọ inyocha Ekweremadu maka ịkpa nkata, mmerụ ikike ọkwa ya nyere ya na ibupu ego nke Bekee kpọrọ 'money laundering'.
Ka Saraki banyere n'ụlọomeiwu ma bido 'plenary', o kwutere okwu na Ekweremdu abịanwughị, ma kwuo na-ekwesịrị ịgba mbọ hụ na ọchịchị onyekwuouche ya emebighị.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 2
Omeiwu Sam Anyanwu kwuru na ya na Ekweremadu nọ ụnyaahụ, mana onweteghị akwụkwọ gosiri na ndị uweojii na-achọ ya.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 3
Ka e mechara 'plenary', ndị omeiwu kpebiri na ndị ọrụ nchekwa kwesịrị ịpụ n'ụlọ osote onyeisi sineeti bụ Ike Ekweremadu ozugbo, ka o nwee ike rite ikike ruru ya.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 4
N'ụtụtụ a, Saraki so na ndị egbochiri ịpụ n'ezi ụlọ ya.
N'aka ọzọ, onyeisi ala Naịjirịa bụ Muhammadu Buhari kelere ndị siri na APC pụọ taa ka ọ gara ha nke ọma.
O kwuru nke a site na akara Twita ya bụ @MBuhari:
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 5

Ebe foto si, Uche Anichukwu
Ihe onyoonyo na-egosi ebe ndị EFCC chewere n'ihu ụlọ Ekweremadu:











