Ọpụpụ ndị omeiwu: 'Anyị kwụ chịm' - APC

Ọkọlọtọ otu APC

Ebe foto si, @BolajiAbdullahi/Twitter

Oge e ji agụ akụkọ nkeji 2

N'ime akwụkwọ ozi onye odeeakwụkwọ mgbasa ozi otu APC bu Bolaji Abdullahi depụtara, o kwuru na otu ha kwụ si ike.

O kwuru na n'izuụka ole na ole gara ka ha na-agbaghrị ị hazi ihe gbasara ndị bu iwe n'etiti ha n'ụzọ dị mma.

Mana ọpụpụ ọtụtụ mmadụ mere taa gosiri na ndị ahụ pụrụ apụ bu ihe ọzọ n'uche eso ha.

N'ọnụ ya "Nsọpụrụ anyị nwere n'ebe ndị Naịjirịa nọ mere n'anyị ga-aga n'ihu ị hazi pati anyị na ntuliaka nke 2019 n'abịa"

Cheta na elekere ole na ole gara na onyeisi ụlọomeiwu ukwu bụ Bukola Saraki kwupụtara na ndị omeiwu ruru mmadụ 15 ahapụla APC.

Saraki gụpụtara akwụkwọ ij maa ọkwa ahụ n'ụlọomeiwu, taa bụ Tuusde, Julaị 24.

Ka nke a na-eme, n'ụlọomeiwu nke nta (House of Representatives), ihe karịrị mmadụ 33 hapụkwara otu APC gafee PDP, ebe mmadụ anọ banyere ADC.

Ndị na aṅụrị n'ime ụlọomeiwu mgbe ndị APC gafere n'otu ha

Ebe foto si, NASSTV/SCREENCAPTURE

Nkọwa foto, Ndị PDP na aṅụrị n'ime ụlọomeiwu mgbe ndị APC gafere n'otu ha

Ndị omeiwu gafere PDP gụnyere Dino Melaye, Rabiu Kwankwaso na Usman Nafida.

Lee aha ndị sinatọ pụrụ n'APC dịka ụlọọrụ sineeti si depụta ya n'Twitter.

Skip X post, 1
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post, 1

Ebe Abdul-aziz Nyako na Monsurat gafere otu ADC.

Skip X post, 2
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post, 2

Ọpụpụ ndị a mere ka ndị otu PDP bụrụ pati kacha n'ụlọomeiwu ukwu. Ugbua, ndị omeiwu si PDP dịzị 64 ebe ndị nke APC dị 45.

Ka ọ dị ugbua, ndị otu PDP nọ n'ụlọomeiwu na-enwe ọṅụ maka ihe a mere.

Ndị hapụrụ APC n'ụloomeiwu nke nta gụnyere Danburam Nuhu, Mark Gbilah, Razak Atunwa, Ahmed Garba Bichi, Abdulsamad Dasuk na Zakari Mohammed.

Ndị ọzọ bụ Sani Rano, Barry Mpigi, Ali madaki, Dickson Tackighir nakwa Hassan Saleh.

Cheta n'ụtụtụ, anyị wetaara unu akụkọ na ndị EFCC wakporo ma gbochie ụlọ Saraki na osote ya bụ Ike Ekweremadu.

Mgbe BBC na Yusuph Olaniyonu bụ ọnụ na-ekwuchitere Saraki kpara n'ekwentị, o kwuru na ọ maghị ebe Saraki nọ, mana e mechara hụ Saraki n'ụlọomeiwu ebe ọ nọ kwuputa ngafe ya na ụfọdụ ndị omeiwu ndị ọzọ.

Nke a sotere ọtụtụ ozi BBC zigara ekwenti ha mgbe akụkọ gbasara mkpochi ụzọ a pụtara ihe.

Onye enyemaka ya bụ Banks Omishore, tinyere na Twitter na ha ji ụgbọala ha nyachie ya ịpụ n'ezi.

Skip X post, 3
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post, 3

Echefula na ndị uweojii kpọrọ Saraki oku ịza ọnụ ya maka etu ohi e zuru n'Offa si metụta ya.

Akara ntụ-ntụ

Akụkọ ndị ga-amasị gị: