Oshiomole: Buhari ga-achụpụ Ngige

Ebe foto si, Adams Oshiomhole facebook
Onyeisi Pati APC bụ Adams Oshiomole eforola ntụtụ taa na ọ ga-achụpụ minista na-ahụ maka ọrụ na nrụpụta bụ Chris Ngige ma ọ bụrụ na o nupuisi n'okwu ya.
Oshiomole gwara Ngige na minista ụgbọelu nke steeti bụ Hadi Sirika ka ha duo ndị otu ọchịchị nọ n'okpuru ministri ha n'iyi ọrụ n'ime otu izuụka ma ọ bụ ha hụ isi ya.
Oshiomole n'akwụkwọ ozi oweputara n'oge gara aga kwuru na nnupuisi n'ime nke a megidere iwe otu APC nakwa ntuziaka onyeisiala Bụ Mohammadu Buhari.
N'okwu ya "ọ bụrụ na minista a jụụ, aga achụpụ ya n'ọkwa, anyị ga-alaghachi n'okpuru nrubeisi nke pati anyị, onweghi onye ọbụla karịrị pati anyị.
Ọ bụ pati ahụ nyere ọkwa minista nyere ndị a ha jụrụ idu n'iyi ọrụ ọkwa, ọ bụ ihe ọjọ minista iji ikikere onwere na-enupuru pati ya isi.

Ebe foto si, @LabourMinNG
"O doro m anya na onyeisiala akwadoghi agwa ọ na-akpa iwepu aha ndị onyeisiala nyere ha".

Akụkọ ndị ga-amasị gị:






