Unizik: Anyị chọrọ ka a kutuo ụlọọgwụ ụlọakwụkwọ anyị maọbụ rụgharịa ya - Nwaakwụkwọ

Ebe foto si, Punch/Twitter
Iwe na obi mgbawa ka ụmụakwụkwọ mahadum Nnamdi Azikiwe ji nata ọnwụ otu onye n'ime ha bụ Francis Madubuobi.
Francis nwụrụ n'ụzọ ebe a na-ebuga ya ụlọọgwụ ebe ọ tụbọsịrị ka ọ na-egwu egwuregwu bọọlụ nkata dịka otu nwaatakwụkwọ si kwuo.
O kwuru na iwe ụmụakwụkwọ abụghị naanị maka ọnwụ ahụ kama maka na ụlọọgwụ dị n'ụlọakwụkwọ ahụ enweghị ngwọọrụ iji leta ya mere o jiri nwụọ tupu e ruo ụlọọgwụ ọzọ.
Nwata akwụkwọ ahụ na-achọghị ka a kpọọ aha ya gwara BBC Igbo na nke a abụghị mbụ nwataakwụkwọ na-anwụ maka na ụlọọgwụ ahụ enweghi ngwọọrụ.
Ụmụakwụkwọ jiri maka ọnwụ Francis we pụa n'igwe igosi iwe ha mana onyeisi ụlọakwụkwọ ha ekweghi ka ha mee ngagharị ha n'ime ụlọakwụkwọ.
Nke a mere ha jiri pụọ n'ezi ime ngagharị ahụ mana nwataakwụkwọ ahụ kwuru na onyeisi ụlọakwụkwọ ahụ kpokobara kọmiti inyocha ka Francis anwụrụ n'ime ụlọọgwụ ha ka ọ bụ n'ụzọ.
Ụmụakwụkwọ ahụ na-ekwupụakwa iwe ha na twitter.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 1

End of X post, 2
Mhiz Sophia depụakwara maka ọnwụ ahụ n'akara twitter ya.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 3
Francis nọ n'afọ ikpeazụ ya ebe ọ na-agụ gbasara ụmụanụmanụ a na-akpọ 'Microbiology' na Bekee.
Onye nkwuchiteọnụ ụlọakwụkwọ ahụ bụ Emmanuel Ojukwu kwuru na nwata akwụkwọ nwụrụ site n'ọrịa obi.
Ọ kọwara na ụmụakwụkwọ amaghị na anaghị agba onye tụbọrọ site n'ọrịa obi mmiri mana ndị ụlọọgwụ ụlọakwụkwọ ahụ kwuru na nwaata ahụ anwụọla tupu ha ebute ya n'ụlọọgwụ.

Ebe foto si, Chukwuemeka Frank
Ojukwu kwuru na ọ bụ nnukwu ihe mwute nye ezinaụlọ na ụlọakwụkwọ ahụ maka na Francis kwesiri ile ule ikpeazụ ya taa we gụsịa.
Mana o kwuru na ọ bụghị ụlọakụkwọ ka ụta dịrị n'ọnwụ Francis n'ihi n;ọnwụrụ ebe ọ tụbọrọ dịka ndị ọrụ ahụike ha siri kwuo mana ụlọakwụkwọ ahụ eguzobela kọmiti ga-eleba anya n'ọnwụ Francis.

Akụkọ ga-amasị gị: