Etu ụlọọgwụ UNN siri gbanye m mmiri mmebiri emebi n'ahụ - Nwata akwụkwọ

Onye nọ n'elu akwa ụlọọgwụ

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Chidozie kwuru na ha nyere ya driipu asato n'agbanyeghị n'onweghi ihe pụtara na nyocha emere ya
Oge e ji agụ akụkọ nkeji 2

Otu nwata akwụkwọ na Mahadum Naịjirịa na Nsukka bụ Chidozie Okonkwo ebola ụlọọgwụ ụlọakwụkwọ ahụ ebubo na ha nyere ya ọgwụ driipu mebiri emebi.

Okonkwo, na-agụ 'Bekee' na mahadum ahụ, gwara BBC na ịba na-emesi ya ike kpatara oji malite ị ga n'ụlọgwụ dị n'ụlọakwụkwọ ha n'izuụka gara aga.

N'ọnụ ya; "Ajụ na-ebu m, m ga-kọrọ dibia bekee ihe na-eme m na ndị ọzọ"

Ha nyere ya akwa n'ụlọọgwụ ahụ ma narakwa ya puku naịra n'ọkara n'agbanyeghị n'ụgwọ akwụkwọ ya kwesiri ịkpuchi ụgwọ ọgwụgwọ.

Tupu abali ọzọ erue, ndị ọrụ ụlọọgwụ ahụ agbaala Chidozie ọgwụ dị icheiche na driipu asatao n'agbanyeghi na onwebeghi ihe pụtara na nyocha emere ya.

Foto driipu mere mmebi

Ebe foto si, @emmyskillful

Nkọwa foto, Nwanne Chidozie sere ya bú driipu foto mgbe ó chópútara na ó mebiela

Mgbe ejima ya Chiamaka bịara ị leta ya n'ụlọọgwụ ka ọ chọpụtara na driipu nke etinyere ya emebiele kemgbe Jenụwarị 2018, o lee ndị ọzọ etinyechara ya n'ahụ chọpụtakwa na ha niile emebiela.

Ọ malitere ị bara ndị ọrụ ụlọọgwụ ahụ mba ma kpọrọ kwa nwanne ya pụọ n'ụlọọgwụ ahụ. Ya bụ ihe were nwanne ya nwoke bụ Emmanuel iwe mere o jiri kwuputa ya n'elu Twitter.

Skip X post
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post

Osote onyeisi mahadum Nsukka bụ Ọkammụta Charles Arinzechukwu Igwe gọrọ na ya bụ ihe mere n'ụlọakwụkwọ ahụ.

Ọ sị "anụghị m akụkọ dị etu ahụ. O nwebeghi onye bịara kọro anyị na ihe dị etu ahụ mere n'ụlọakwụkwọ anyị ebe a'

Dibia bekee ọhụrụ gwara Chidozie na ọ bụ ịba na taịfọd na-eme ya, o kwukwara na nje akpọrọ 'E.coli' abaala ya n'ime ahụ nye ya ọrịa ọzọ siite na driipu mere mmebi enyere ya.

Ụzọ n'ezi Mahadum Naịjirịa Nssukka

Ebe foto si, iStock

Rue ugbua, ụlọọgwụ ahụ enyebeghi Chidozie ihe pụtara na nyocha emere n'ahụ ya kama ha arịọla ya na nwanne ya nwaanyị mgbaghara maka ọgwụ mebiri ha kwetere na ha nyere ya.

Chidozie kwuru na oteela aka ụlọọgwụ ahụ anaghị enye ụmụakwụkwọ ọgwụgwọ zuru oke, na ike ịgba nkịtị agwụla ya.

Akara ntụ-ntụ

Akụkọ ndị ga-amasị gị:

Akara ntụ-ntụ