Akụkọ dị mkpa na mgbede a: Ewepụla ọnụ na-ekwuchitere ụlọomeiwu na Platu steeti na onye ndu ndị ụlọomeiwu

Oge e ji agụ akụkọ nkeji 1

Akụkọ ndị dị mkpa

Ụmụnwaanyị Igbo

Ebe foto si, Rodney Patrick

Okwu na-ewu n'elu soshal midia ọkachasị Twita bụ ihe gbasara ikikere nwaanyị ịzụta maọbụ rite ala n'aka nna ya n'ala Igbo.

Ụfọdụ na-ekwu na ha kwenyere n'omenala a ebe ndị ọzọ na-ekwu n'oge eruola iji gbanwe ya bụ omenala.

Eze Madumere

Ndị ụlọomeiwu Imo steeti nwere nzuko n'isi osote gọvanọ ha bụ Eze Madumere ekpebiela na ọ bụ ọkaikpe nke steeti ahụ ga-ekwu ma aga-achupụ ya n'oche ọchịchị n'ime ọnwa atọ maọbụghị.

Cheta na ndị ụlọomeiwu nke Imo steeti kwuru na ha ga-achutu Madumere maka ebubo nrụrụaka ha boro ya.

N'okwu yiri ibe ya

Achụturu Peter Azi bụbu ọnụ na-ekwuchitere ụlọomeiwu nke Platu steeti n'ọkwa ya n'ehihie taa.

Onye ọọ ewepụrụ bụ inyeisi ndị kachasị n'ọnụọgụgụ bụ Henry Yunkwap.

N'akụkọ ofesi

Skip X post
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post

Praim minista mba Jamini na Onyeisiala mba Amerịka amaala aka dịka ha na-akwado ịga nzụkọ otu NATO na Brussels.

Donald Trump na-ebo ụfọdụ mba n'ime ọgbakọ ahụ ebubo ịkpachi ego ha.

N'Egwuregwu,

Ndị nso egwuregwu bọọlụ na Ingland

Ebe foto si, BBC Sport

Ebe niile tọgbọ chakoo ugbua na mba Briten ebe otu egwurewgwu ha na-akwado ị zute Kroeshia na asọmpị ga-egosi onye ga-abịa nso ị bu ikombaụwa.

Anyị ga-ama onye ga-emerị ma ọ kụọ elekere asaa nke mgbede a.

Gee nkeji nke mgbede a:

Aha nkeananụānụ, Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile