Dọkịta Bumbum: Ọ bụ na ọkpụisi amaghị akpụ ka ọ bụ na agụba adịghị nkọ?

Ebe foto si, Getty Images
Dọkịta bekee a ma ama dịka 'Dọkịta Bumbum' agbafuola maka ọgwụ ọgbara otu nwaanyi chọro ka o nwelita otele ya.
'Dọkịta Bumbum' riri mbọmbọ ọso mgbe ọhụrụ na ọgwụ ya rụfere ọrụ a chọrọ ịrụ were gbuo nwaanyị bịara ka owelitekwuo otele ya.
Dọkịta ahụ ezigbo aha ya bụ Dennis Furtado malitere ịrụ ọrụ n' otele ya bụ nwaanyi n'ụlọ ya ebe o bi na Rio de Janeiro mgbe nwaanyị ahụ bụ Lilian Calixto dara n'ọrịa, dịka ndị uweojii na-enyocha ya bụ okwu siri kwuo.
Mgbe Furtado huru na ya bụ ụkwa akarịala akị, o buru Calixto gbaga n'ụlọọgwụ ebe ọ nọ kubie.
Furtado siri ebe ahụ rie mbọmbọ ọsọ ebe ụlọikpe jiri nye ikike sị chọwa ya jide.
Ụgbụa ya bụ ụzụ na akpụ ottele nọzị na-ọsọ.
Dọkịta Furtado bụ onye gbara afọ 45 na apụta na onyonyo ndị Brazil ma nweka ndị na-eso ya na instagram ruru 650,000.

Ebe foto si, Facebook
Ọchọmma nwaanyi bụ Calixto bụ nke gbara afọ 46 nụrụ di nke ha abụọ mụtara ụmụ abụọ.
Akụkọ kọro na ya bụ nwaanyi na-arụ ọrụ na ụlọakụ dị na Kuiaba bụ ebe osi gawa Brazil maka ime ka ike ya bukwuo ibu bụ ebe ọ nọ zuta ọnwụ ya.
Ndị ụlọọgwụ ebutere Calixto bụ Barra D'Or dị na Rio de Janerio si na ha gbara mbọ ịzọpụta ya mana mbo ha enweghị isi.
Ugbua ndị uweojii si na-akpụrụla enyi Furtado nwaanyị bụ onye ha na-enyo na aka ya dị na ya.
Furtado ji oba ozi soshal media mee onwe ya ọkacha akacha na ime ka ahụ nwaanyi buo ibu ma ọ bụ pekwuo mpe.









