Aka akparala dọkịta ghọrọ yahoo-yahoo

Williams
Nkọwa foto, Thompson Williams dị afọ iri abụọ na asatọ bụ dọkịta gbaghara ọrụ nleta ahụike ya bụrụ 'hacker'

Saa anya mmiri ka isi e ji ịntanet ezipụ ego gi dị n' obaego iji gbalahụ ngaramara.

Dịka otu onye ji intanet ezupụ ego ndị.mmadụ dị na ọbaego nke akpọrọ'hacker' na bekee gbara ama, ụlọakụ ndị nọ n'ala Naijiria enweghị ezi nchekwa dịka ndị mba ofesi nke mere na ọ dị mfe mmadụ nwere nka intanet izubu ego site n'ọba egọ ndị ahụ.

Nɗị uweojii nwụchiri Michael Thompson Williams maka iji nka iṅtanet zụọ ụgbọala Porshe dara nde naira iri abụọ na ise ma mee ka onye ọ zụrụ ahịa nweta 'alert' na adịghị ego ọbụla ọ kwụnyere ya.

Onye ọ zụrụ ahịa bụ Abiodugun Adewale wegara ndi uweojii mkpesa ha were chọwa nwa amadị ɓụbu ɗọkịta ma nweta ya na Lekki, dị na Legos.

Thompson onye rụburu ọrụ n'ụlọọgwụ ndị nwere agba na Legos tupu ọ ga biri na Canada kọwara ndị ntaakụkọ ka ya si eji nka intanet enyopụta oge ndị nnukwu mmadụ jị ezipụ egọ na ịntanet ma jiri nka ya ɗobiri ego ka o siri masị ya.

Otu n'ime ụgbọala e nwetaara n'aka Williams
Nkọwa foto, Williams na-eji ego o nwetara na 'credit card' ya zụọ ụgbọala na 'software' dị iche iche

Williams onye kwupụtara na ya ezuola ego onye ihe nkiri Amerika ama ama bụ John Travolta ọtụtụ mgbe sị:

" Onye ọbula bụ hacker bụ ụlọaƙụ nye onwe ya. I nwere ike izupu ego nɗi mmadụ nwere n'ọbaego ha were ya zụo ihe masiri gị n' ụlọahịa ɗi nanintanet. John Travolta na-ezipụ nnukwu ego kwa izuụka. A dọbitala m ego ya ọtụtụ mgbe ma nwere ya zụọ ngwa 'software' ndị nji amụtawanye nka m ."

Gere ihe okwuru ebe a:

Aha onyonyo, Ihe Williams Thompson kwuru

Onyeisi ndị uweojii bụ Imohimi Edgal kwuru na ha ga-akpụpụ Williams ụlọikpe ma ha mecha nyocha.

Ọ tụrụ arịrị na nwoke ahụ ɗị afọ iri abụọ na asatọ ji nka ya eme mpụ ma ɗọọ ndị omekeome ṅọ na Legos aka na nti si ha chọrọ ezi ọrụ.

Akụkọ ga-amasị: