A gbaala dokịnta akwụkwọ maka itu ụmụnwaanyị 11 ime

Ebe foto si, CBC
N'ọnwa Nọvemba, a gbara dọkịta Norman Barwin akwụkwọ ka nyocha DNA e mere gosipụtara na ọ bụ ya bụ nna nwa onye bụbụ onye ọrịa n'ụlọọgwụ.
Akụkọ maka ebubo a pụtara ihe n'ọnwa Novemba afọ gara aga ka Daniel na nwunye ya bụ Davina Dixon na nwa ha nwanyị bụ Rebecca gbara Dkta Barwin, Nelligan, O'Brien na Payne akwụkwọ n'ụlọikpe dị n'Ontario.
Ezinaụlọ nwere mkpebi ịiwepụ okwu ahụ ụlọikpe ka ha chọpụtachara na Rebecca abụghị Maazị Dixon mụrụ ya.
Ezịnaụlọ Dixon gakwuru Dkta Barwin n'afọ 1989 ka o nyere ha aka ịtụ ime, e mecha mụọ Rebecca na afọ na-eso ya.
Dịka akwụkwọ ebubo ha siri kwu: "Davina anọkwataghị n'ihi na ya na Daniel nwere anya na-acha ka ihu igwe, ebe Rebecca nwere aja na-acha aja,aja.
Ha a mechara chọta onye ha chere na ọ bụ nwanne Rebeccam onye nne ya bụkwa otu nwaanyị garala nleta maka itụ ime n'aka Dkta Barwin.

Ebe foto si, Rebecca Dixon
O pekata mpe mmadụ 11 na-ebo ebubo na ọ bụ ya bụ nna mụrụ ha, dịka ndị ọkaiwu ha siri kwuo.
Ndị a na mmadụ iri ise(50) ndị ọzọ ndị nwetara nleta n'aka dọkịta ahụ ndị nyocha DNA ha eyighị nke onye ha kpọrọ nna mụrụ ha, ghbara ya akwụkwọ n'ụlọ ikpe.
Ebubo gbadoro ụkwụ n'ihe mere kemgbe afọ 1970 ma metụta ụlọọgwụ abụọ na-ahụ maka inyere ndị ime na-esiri ike aka dị n'Ottawa, Ontario bụ Broadview Fertility Clinic na Ottawa General Hospital.
Mana ọkaiwu Dkta Barwin bụ Karen Hamway dekweghị saa ebubo ndị a e boro nsonso a.
Ndị ọkaiwu Peter Cronyn na Frances Shapiro Munn kwuru na ha hụrụ mmadụ iri na otu ndị nne na nna ga gara hụ Dkta Barwin maka inweta nleta gbara ime isi ike ndị bụ nwa ya dịka nyocha DNA ha mere siri gosipụta.
Ụfọdụ bụ ndị e kwesịrị inweta nkwado ọbaraọcha(sperm) onye ha amaghị, ebe ụfọdụ bụ ndị kwesịrị inweta ọbaraọcha nke di ha.
Ha hụkwara mmadụ iri na isii ndị e kwesiri iji ọbaraọcha nna ha mụọ mana nyocha DNA e mere eyghị nke nna ha.
Dịka Cronyn na Shapiro Munn siri kwuo, n'ọnọdụ ndị a, amaghị ndị bụ nna mụrụ ha na'ezie.
Ha gara n'ihu kwuo na e nwere mmadụ iri atọ na ise ndị e kwesiri ka e jiri ọbaraọcha ndị akpọghị aha ha ndị nwere ike ha agahị abụ ndị e chere na ha bụ.
E nyebuọla Dkta Barwin n'afọ 2013 maka intinyere mmadụ atọ ọbaraọcha ekwesighị n'ụlọọgwụ ya dị n'Ottawa.

Akụkọ ndị ga-amasị gị:










