Akụkọ kachasi n'abalịa: Otti ọ ga-emeri Ikpeazụ na 2019?
Akụkọ ndị kachasị mkpa mere taa.
Ọchịchị Abia steeti na 2019

Ebe foto si, @okezieikpeazu
Alex Otti zọburu ọkwa ọchịchị gọvanọ Abịa steeti n'afọ 2015, ekwuola na ọ ga-emeri Okezie Ikpeazụ ọzọ na ntuliaka nke 2019.
Otti kwuru ọ mụrụla akọ site n' ihe mere ya na ntuliaka afọ 2015.
Ndị nwụrụ na Ghana

Ebe foto si, Getty Images
Ụlọọrụ ebe a na-egwupụta ọlaedọ dị na na Brong Ahafo nke dị nso Accra na mpaghara ndịda nke mba Ghana adaala, gbuo mmadụ isii ma merụọ mmadụ abụọ ahụ.
Ihe mberede a mere n'ogige Newmont bụ ụlọọrụ Amerịka nke kachasị emepụta ọlaedo n'ụwa.
Na mba ofesi

Ebe foto si, Getty Images
Onyeisiala mba America bụ Donald Trump akatọola ndị mba Syria maka ebubo eboro ha na ha ji ngwaagha kemikal gbuo ọtụtụ ndị mmadụ n'obodo Douma ụnyaahụ.
Trump boro onyeisiala mba Syria bụ Bashar al-Assad nakwa Vladimir Putin bụ onyeisiala Russia ebubo na ha ma ihe gbasara mwakpo a.
N'akụkọ egwuregwu

Ebe foto si, AFP
Ndị Arsenal ji ọkpụ atọ nke Southampton satara abụọ wee merie n'asọmpi premier league ha gbara na mgbede a.
Pierre-Emerick Aubameyang bu ụzọ nyere ndị Arsenal goolu, nke bụ nke isii ọ na-enyere ha kamgbe e ji zụta ya n'ọnwa Jenụwarị.
Achụpụrụ Mohamed Elneny bụ onye Arsenal nakwa Jack Stephens bụ onye Southampton n'ime asọmpi ahụ.
Ihe ndị ọzọ ị kwesịrị ịma taa
Gere akụkọ mere na mgbede a n'otu nkeji
Ihe nkiri taa










