Bukola Saraki: Ndị uweojii chọrọ ịkatọ aha m

Saraki na Idris

Ebe foto si, Getty Images

Oge e ji agụ akụkọ nkeji 2

Onyeisi ụlọomeiwu ukwu nke Naịjirịa bụ Bukola Saraki ekwuola na oku ndị uweojii kpọkwara ya ọzọ bụ ụzọ ha ji chọọ ịkatọ aha ya n'ihi ndọrọndọrọ ọchịchị.

Ndị uweojii kpọrọ Saraki ọzọ ka ọ bịa kwuo etu ohi e zuru n'ụlọakụ Offa ma gbuo ihe ruru mmadụ 17., si metụta ya; ma aka ya ọ dị ya ka ọ dịghị ya.

Cheta na ndị uweojii kpọburu ya ụdịrị oku a n'ọnwa Juun, ka ụfọdụ ndị e jidere maka ohi a kpọrọ aha ya, na ọ ma maka ya bụ ohi.

Saraki kwuru sị na oku a onyeisi ndị uweojii bụ Ibrahim Idris kpọrọ ya bụ ụzọ e si enweta akara ọma na ndọrọndọrọ ọchịchị, nke Bekee kpọrọ 'cheap political points'.

Ka ndị uweojii kpọkuru ya oku ọzọ, Saraki kwuputara okwu a site n'akwụkwọ Yusuph Olaniyonu bụ onye ndụmọdụ ya pụrụiche nakwa ọnụ na-ekwuchitere ya, depụtara ụnyaahụ.

Saraki kwuru sị "ndị uweojii ejirila ndọrọndọrọ ọchịchị nakwa mpụ na nrụrụaka mebie nyocha ha na-eme maka ohi e zuru n'Offa.

"Ha atụgharịala ya ịbụ ngwaọrụ pati nọ n'ọchịchị ji emegide ndị ha na-ahụta dịka ndị iro ha; ihe ha ji ata ndị mmadụ amusu ma mebie aha ha ijiri aka ha họrọ n'elu ikpookwu (platform) nke ha ga-eji chụọ ebumnobi ha, nakwa ụzọ ha si emegide ndị ọ ga-abụ ha pụọ n'APC o mebie ohere pati a na ntuliaka na-abịa."

Saraki kwukwara na ndị uweojii ekpebiela ndị a na-enyo enyo ha ga-akpọpụta n'ụlọikpe n'Ilorin, Kwara steeti na Wenesde, site na ndụmọdụ Mohammed Etsu bụ 'Director of Public Prosecution (DPP)'.

Lee ihe Saraki dere na Twitter gbasara oku a kpọrọ ya.

O kwukwara na ọ bụ usoro e jiri chọọ ịkwụsị atụmatụ ndị mmadụ na-ekwu na ụfọdụ ndị ụlọomeiwu ukwu na nke nta na-achọ ịpụ n'otu pati All Progressives Congress (APC).

Skip X post, 1
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post, 1

O kwuru na a sị na ọ bụrụ na anwụchie ya n'etiti Tuusde na Wenesde, na ọ ga-egbochi ndị mmadụ isi n'APC pụọ.

Skip X post, 2
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post, 2

O kwuru na oku a kpọrọ ya agaghị egbochi ihe ọbụla gbasara ọnọdụ ya maka ihe ga-eme na ntuliaka 2019.

Skip X post, 3
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post, 3

O kwuru na ndị na-akwado ebubo ọhụrụ a gbasara ohi Offa, ga-ada maka na aka ya dị ọcha.

Skip X post, 4
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post, 4

Saraki kwuru na "eziokwu ga-emeri".

Skip X post, 5
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post, 5

Akara ntụ-ntụ

Akụkọ ndị ga-amasị gị:

Akara ntụ-ntụ