
Ndị e chere na ha bụ Bọko Haram wakporo ụlọakwụkwọ ụmụnwaanyi dị na Dapchi,Yobe steeti na mpaghara ọwụwaanyawụ ugwu-awụsa, Naịjiria.
Mịnịsta na-ahụ maka mgbasa ozi bụ Lai Mohammed, kwuru na ọ bụ ndị ụmụaka ụmụakwụkwọ nwaanyị otu narị na ise na otu nwoke ha gbapụtara n'aka.
Ka ọ si dị onweghị onye ma ọnọdụ ụmụaka ise ndị e kwuru na ha nwụrụ 'ime ndị a tọrọ.
Aka ndị Boko Haram ka ji otu nwa nwanyị onye bụ onye otu Kraist nke jurụ ịgọnarị okwukwe n'ime Kraisti.
A tọrọ ụmụaka ndị a n'ụlọ akwụkwọ ha dị na Dapchi otu ọnwa gara aga.
Gọmentị na- ekwu na onweghị ụgwọisi ọbụla ha kwụrụ nke o ji enwe onye Boko Haram eji isi ha gbara ụmụaka ahụ.
Mana ndọrịtaụka sọ ihe gọọmentị na-ekwu na ọ nweghị ụgwọ a kwụrụ.

Ebe foto si, Reuters
Otu ụlọọrụ ntaakụkọ bụ Sahara Reporters kwuru na gọọmenti kwụrụ Boko Haram "nnukwu ego" ma werekwa isi ụfọdụ ndị Bokọ Haram nọ na mkpọrọ gbara isi ụmụaka ndị ahụ.
Ọnụ na-ekwuchiere onyeisiala bụ Garba Shehu gọrọ.
Ọ kwara BBC na ntọhapụ ụmụaka dapchi bụ "nkwekọrịta nwoke na ibe ya"nke butere 'gbanyọọkụ na mkparịta ụka ha na ndị aghaọlụọọla.
Ka ọ dị ugbua, otu PDP ekwuola na nntọrọ na mgbapụta ụmụaka Dapchị bụ ụzọ ha ji achọ inweta obi ndị mmadụ maka ntuliaka 2019.
