Ụmụakwụkwọ 50 efuola na mwakpo Yobe steeti

Gọomentị ndị Yobe steeti ekwuputala na a na-achọ ụmụakwụkwọ ruru 50 na Yobe steeti ka ndị bu egbe echere na ha bụ ndị Boko Haram wakporochara ụlọakwụkwo ha
Onye ntaakụkọ gwara BBC na-achọtala mmadụ iri n'ime ụmụakwụkwo ahụ gbara ọsọndụ ka aka na-achọ ndịọzọ n'ọhịa.
Ndị bu egbe zọbatara n'ime obodo ahụ ma gaba n'ụlọakwụkwọ sekondịrị ahụ. Mgbe ha ruru ọ bụrụ na ụmụakwụkwọ ahụ na ndị nkuzi ha agbabala n'ime ọhịa.
Kemgbe ugbu a, a matabeghị ọnụọgụgụ ndị ka nọ n'ime ọhịa ebe ndị obodo Dapchi ebe nke a mere so achọ ụmụakwụkwọ a.
Cheta na ndị Boko Haram tọrọ ụmụakwụkwọ Chibok 276 n'ụdị mwakpo yiri nke a na afọ 2014.
Ndị hụrụ mgbe ihe a mere sị na ndị a bu egbe bukwa ụgbọ agha ruru iri n'abụọ n'ọnụọgụgọ were bata obodo ha.
Ndị a malitekwara ịgba egbe ma na-atụkwa ogbunigwe n'ụzọ mwakpo.






