Mwakpo ndị Boko Haram n'ọnụ ọgụgụ

Ebe foto si, AFP/Getty Images
Onyeisiala Nịajirịa bụ Mohammadu Buhari ekwuola oge niile na emerịela ndị otu Boko Haram mana nyocha BBC mere n'egosi ihe dị iche
Nyocha ndị BBC Monitoring gosiri na otu ahụ egbuola ndị mmadụ karịrị narị itoolu n'afọ 2017 karịa ndị ha gburu n'afọ 2016.
Ha mere nwakpo n'esepughi aka n'ime afọ nke megidere ihe Buhari kwuru na asụpụla ha.
Anyị achịkọtala ọnụọgụgụ ndịa n'ime mapụ nke na-egosi ụdị nwakpo Boko Haram na-eme, ebe ndị ha wakporo na ọnwa nke kachasị njọ
Kedu ndị bụ Boko Haram?
Boko Haram malitere ibuso Gọọmenti Naịjirịa agha n'afọ 2009 n'ebum n'obi ihiwe Islamic Caliphate na mpaghara ọdịda anyanwụ Afịrịka.
Olekwasịrị anya na mpaghara ọwụwaanynwụ-ugwu nke Naịjirịa ebe ọgbaghara a gburula mmadụ puku narị abụọ, chụpụkwa ndị ruru nde abụọ n'ụlọ ha

Ebe foto si, AFP/Getty Images
Boko Haram nke onyeisi ya bụ Abubakar Shekau kpọrọisi ala nye otu Islamic State (IS) na Maachị 2015
Boko Haram kewara n'ime otu dị icheiche n'ọgọsụtụ 2016 mgbe IS kwuru na ewepụla Shekau dịka onyeisi
Otu ejiri gbakọọ ọnụọgụgụ
Onye ntaakụkọ lekwasịrị anya na Naịjirịa bụ Andrew Walker gwara ndị BBC Monitoring na ọdịghị mfe ịgbakọ wakpo niile ha nwere maka ụdị ntaakụkọ ọdịnaala nke Naịjirịa
- BBC Monitoring nyochara akụkọ ndị ntaakụkọ ọdịnaala na nke ndị mba ndị ọzọ wepụtara maka nwakpo emere n'afọ 2016 na 2017 nke nyere nkọwa ụdị na ebe ndị Boko Haram wakporo
Ọnụọgụgụnwakpo na-arị elu n'ọtu ebe
Akụkọ kwuru na Boko Haram mere nwakpo dị otu narị na iri ise n'afọ 2017, nke karịrị ndị ha meburu n'afọ ndị gara-aga dị otu narị na iri abụọ na asaa
Ebe ha mere nwakpo karịsịa n'ọnwa Jenụwarị, nke megidere ihe onyeisiala Buhari kwuru na ha nwụọla

Ndị otu a na-awakpo otu ebe kamgbe afọ abụọ gara-aga.
Naịjirịa bụ ebe akacha wakpo n'afọ 2016 na 2017 dịka Borno Steeti bụ ebe nwakpo a bidoro. Mba Nijee nwetara nwakpo kachasị obere
Ha wakporo mba ndị ọzọ dịka kameruun, Chadị na Nijee n'afọ 2017


Usoro nwakpo
Akụkọ kwuru na Boko Haram jịrị ngwaagha mee nwakpo iri itoolu, ebe ha jịrị ogbunigwe mgbagbuonwe wakpo ugboro iri ise na itoolu n'afọ 2017
Ebe nwakpo ha na mpaghara Kameruun na Chadị karịrị na ndị ha jiri nwaagha mee n'afọ 2016.


N'ime ozi a, Naịjirịa nwetara nwakpo ejiri ogbunigwe mee dị iri na itoolu n'afọ 2016 na nke dị iri atọ na asatọ n'afọ 2017, ebe Kameruun nwetara ihe yiwere ya n'ọnụ ọgụgụ
ogbunigwe mbagbu onwe karịrị na mpaghara Maiduguri nke Naịjirịa.
Ọnụ ọgụgụ ndị egburu na-arị elu
Ndị Boko Haram gburu ihe karịrị mmadụ narị itoolu na iri isii na asaa n'afọ 2017, nke karịrị mmadụ narị itoolu na iri n'afọ 2016.
Ebe akacha gbue ndị mmadụ na Maiduguri n'afọ 2017 dịka ndị mmadụ agbala ọsọ ndụ
Ebe ndị ọzọ egburu ndị mmadụ bụ n'ime obodo Magumeri, Konduga, Damaturu na Mubi
Ọtụtụ ndị mmadụ Boko Haram gburu n'afọ 2016 na 2017 bụ ndị bi n'ime obodo n'akwa ndị agha
Ndị Boko Haram na-aga n'ịhụ n'ịwakpo ụlọ ndị alakụba n'akwa ndị gbara ọsọ ihe ize ndụ (IDPs)

Ihe jịkọtara Boko Haram na IS
A matabeghị ihe jịkọtara Boko Haram na IS
Nanị nwakpo iri na atọ n'ime nwakpo dị otu narị iri ise na otu bụ ihe ndị IS kwetara n'ọbụ ha mere
Nke a nwere ike ị bụ maka agha ndị agha Sirịa na Ịraakị busoro ndị IS nke mere ha jiri gbafuo n'ebe ha kpọrọ ụlọ ha n'afọ 2017.
Dịka otu ndị Boko Haram siri akpa agwa mere na IS enweghị ike ịkọrọ n'ọbụ mere ụfọdị nwakpo ha na-eme.
Gịnị mere Boko Haram jiri esionwu?
N'ime afọ anọ, ndị mmadụ akatọọla ndị isiagha naịjirịa maka akwadoghi ndị agha nkeoma ibuso ndị Boko Haram agha
Nke a nwere ike igbanwe n'afọ 2018 dịka ndị mba Amerịka ekwetala iresi ndị Naịjirịa Ngwaagha
Tupu oge ahụ eruo, otu a ka na-akpa ike na-iyi ndụ egwu dịka Tomi Oladipo onye ntaakụkọ BBC Afịrịka kwuru.

Ebe foto si, AFP/Getty images
"Agbanyeghị okwu ndị Gọọmenti Naịjirịa n'ekwu na ha emeriela Boko Haram, ndị otu a ka na-awakpo na eyi ndụ ndị Naịjirịa bi na mpaghara ọwụwanynwụ ugwu n'akwa mpaghara Chadị" dịka o kwuru
Oladipo kwuru na Boko Haram na-ezoezo nke mere o jiri dị ike n'ibu agha rute ugbua
"N'ime ọtụtụ afọ ike ndịa nwere ịbata n'ime obodo soro ndị mmadụ biri n'akwa izo onwe ha n'ime obodo bụ ihe nyere ha aka n'ịkpa ike dị egwu" Oladipo kwuru.









