Naịjirịa egbochiela ndị agha gara ịnwụchi Abubakar Shekau

Ebe foto si, AFP
BBC enwetela ozi na Naịjirịa gbochiri njem agha iji nwuchie onyeisi ndị otu na-eyi ndụ egwu bụ Boko Haram bụ Abubakar Shekau.
Ihe nkiri ndi BBC wetara gosiri ka ndị agha Naịjirịa na-aga nso n'ebe Shekau nọ n'ime ọhịa Sambisa dị na ọwụwa anyanwụ ugwu Naịjirịa. Mana, ka ha nọ na njem a, ha nwetere iwu ka ha kwusi.
Boko Haram mechara wakpo ndị agha a, nke ha jiri ụgbọala entinyere ogbunigwe mee.
Ndị agha asaa si Kameruun na Naịjirịa nwụrụ na mwakpo a.
Tupu ndị agha gbakọrọ ọzọ, Shekau were ohere ahụ gba ọsọ.
Otu onye so ndị a na-akpọ 'Civilian JTF' na asụsụ Bekee, so ndị agha Naịjirịa na njem ahụ kọwara ndị BBC.

Ebe foto si, AFP
"Shekau gbara ọsọ hapụ iko ya, Kọmputa ya, uwe ya na atụ ya na egbe ya n'elu okpokoro ya. Ejim anya m hụ nke a."

Akụkọ ndị ga-amasị gị:






