Easter Celebration: Ihe Easter ji apụrụ m iche karịa emume ụka ndị ọzọ'

Ebe foto si, Rita Chokpa-Koji Sam
Emume Easter nke gụnyere Holy Thursday na Good Friday bụ emume pụrụiche n'etiti ndị otụ Kraisti dịka ọ bụ mmemme eji echeta ọnwụ Jisọs Kraistị na mbilite n'ọnwụ ya.
Mana etu ihu ndị mmadụ sị dị iche, ka etu ihe Easter pụtara ha dị.
'Easter pụrụ m iche n'ihi na Ada m mụrụ ejima'

Ebe foto si, Amaka Umeh
Amaka Umeh, onye bụ onyenkuzi kwuru na ezịnaụlọ ndị di ya na-akpọ emume 'Easter mkpa karịa Ekeresimesi.
"Ọ bụ mgbe ndị ezịnaụlọ ndị be di m na-eme mgbakọta dịka ezinaụlọ; ha na-esi ebe niile ha bi lọta, mee ekpere, merụba ụbọchị."
"Ọ na-adịrị anyị ka Ekeresịmesi."
Umeh ka ndị ka nwa agbọ aga ekenye dị ọhụụ na enwe ọnụ na ada ya nwaanyị mụrụ nwa ọhụrụ n'izu a.
O kwuru na, "Easter afọ pụrụ ya iche n'ihi na "abụrụla mmama nnukwu. Nwa m nwaanyị ritere ejima ụbọchị 'Holy Wednesday".
'Emume ụka abalị Easter na-awụm akpataoyi'

Ebe foto si, Amaechi Theo-Vincent
"Amaechi Theo-Vincent ejighị emume Easter achị.
Na nkọwa ya,ọ bụ oge mbilite ọnwụ Jisọs Kraist n'ihi na "ọ bụrụ na o biliteghị n'ọnwụ nkwenye m na Kraistị kara abụ ihe efu."
Ihe Easter jikara pụrụ Theo Vincent iche bụ otu egwu ndị ụka Katọlik na-agụ n'abalị Easter.
" O biliwo ee h O biliwo Jesọ akpọgidere n'obe oh ,Onye mmeri."
"A na-agụ egwu ahụ, na-akụ ịgba, akpataoyi a na-awụ m. ọ dị m ka a hụụ m Jeso ka ọ na-ebilite. Ya mere na ọ na-amasị ịga ụka abalị Easter."
" Ọ bụrụ n'obodo, a na-agba egbe mkpọnala ma elekere iri na abụọ nke ime abalị."Ọ na-awụ m akpataoyi, ụfọdụ anyammiri ọnụ na-apụta n'anya n'ihi ihe Jisọs mere m."
'Emume ụka Easter na-atọ m iche'

Ebe foto si, Blessing Nwobodo-Itua
Blessing Nwobodo-Itua kwuru n'ihe na-atọkarị ya n'Easter bụ emume 'Easter'.
"Oge Easter kachasị tọọ m bụ oge m nọ na mahadụm 'Madona University' n'ihi etu emume Easter si aga ebe ahụ dịka ogbe jikọrọ ọnụ.
"Ma ndị sista, ma ndị fada na ụmụakwụkwọ na-agbakọta ọnụ maka emume ahụ bido n'ụbọchị Good Friday, Holy Saturday nakwa ụka Easter n'onwe ya."
"Mana ugbua n'ihi ọrụ na mkpa dị ọzọ ọ na-ewute m na anaghị esonye n'emume Easter n'ihi na Easter dị mkpa Karia Ekeresimesi."
" Ọ bụrụ na e nweghị Easter, angaghị enwe okpukpere ụka Kraistị."









