Talcum Powder: Ị ma na nzu bekee nwere ike inye gị maọbụ nwa gị ọrịa kansa?

Felicia

Ebe foto si, Getty Images

Ndị ọkaibe n'ihe gbasara ahụike nke akpụkpọ ahụ nakwa kansa akọwala na ite nzu bekee nwere ike i butere gị ọrịa kansa.

ụmụnwaanyị ji nzu bekee achọ mma, ụfọdụ na-ete ya na-apata ụkwụ iji gbochie nkwọkọta ụkwụ ha abụọ, ebe ọtụtụ na-ete ya nwa ọhụrụ iji gbochie akpụkpa ịta ha n'ike n'ihi oke ekpomọọkụ.

Mana ndị ma ihe a na-ekwu n'ahụike kwuru na ọghọm ahụike nwere ike iso ya.

Na mkparịtaụka ya na BBC Igbo nwere, ọkaibe n'ihe gbasara idozi akpụkpọ ahụ bụ Eudoka Nwosu kọwara n'ezie na nzu bekee ụfọdụ na-ebute ọrịa kansa akpa akwa nwaanyị.

Ụmụaka a mụrụ ọhụrụ

Ebe foto si, Getty Images

"Ọ kachasị ụmụnwaanyị na-ete ya na nso akụkụ ahụ nwaanyị ha."

O kwukwara na nzu bekee nwekwa ike ikogbu nwa ọhụrụ ma ọ banye ya n'imi.

"O nwere ike ime ka nwa ọhụrụ kubie."

Gee ihe Nwosu kwuru n'uju ebea:

Aha nkeananụānụ, Talcum Powder: Kwụsilata ka isi ete nzu bekee maka ọrịa Kansa- Ọkammụta akpụkpọahụ

Ọkamụta n'ọrịa kansa na ụlọọgwụ Lagos University Teaching Họspịtal(LUTH) , Dr Remi Ajekigbe, kọwara na,

"Ọtụtụ ihe ụmụnwaanyị na-ete n'ahụ ha ji achọ gụnyere nzu bekee nwere ike ibute kansa."

'E tee ya nzu bekee nwere asbestos n'abụ o nwere ike ịbanye n'ime ara bute kansa ara."

N'ofesi, ọtụtụ ụlọọrụ na-eme nzu bekee ụmụaka emefuola nde kwuru nde dọla n'ikpe ụmụnwaanyị ụfọdụ gbara ha maka ọrịa kansa akpa akwa nwaanyị na-arịa ha.

Otu ndị bụ ọkachamara n'ọrịa kansa nke mba Amerịka a kpọrọ, 'America Kansa Association' kọwara na nzu bekee nwere ndị nwere akọrọgwa bekee 'asbestọs' nke nwere ike ibute kansa ma e kuru ya n'imi.

Ihe anọ ị ga-eme iji gbochie nsogbu

Nwosu na Dkta Ajekigbe nyere ndụmọdụ ndị a:

1. Hapụ ite nwa paụda n'ahụ ha n'ihi na ọ na-akpọchi imi.

2. Kwụsilata ka isi ete nzu bekee.

3. Kama ite nzu bekee maka igbochi akpata, tee okwuma

4. Gụọ akwụkwọ ihe ọbụla e ji achọ mma ka ị mara akọrọngwa e jiri mee ya