Prostate Cancer: Gịnị ka ọrịa a bụ? Kedụ etu ị ga-esi gbalahụ ya?

Aha onyonyo, Ngagharí iwe prostate Cancer

Ọ pụtara ihe taa na aka na-achị Ondo steeti bụ Rotimi Akeredolu anwụọla ebe ọ na-anata ọgwụgwọ n'ọrịa akpụ n'akpa mamịrị nwoke bụ Prostate Cancer.

N'ozi Kọmịshọna mgbasaozi steeti ahụ bụ wepụtara, ọ sị na ọ bụ obi mgbawa ka ha (bụ ndị Ondo steeti) ji kwuputa maka ọnwụ a.

Mana gịnị bụ ọrịa ahụ akpọrọ 'Prostate cancer'? Lee mkpughe nke NHS bụ ngalaba ahụike mba Briten nyere maka ya ebe a.

Ngosi e ji a ma ọrịa ahụ

Nyocha ọbara bụ otu ụzọ ew si achọpụta ọrịa ahụ

Ebe foto si, Getty Images

A na-eji nyocha dị icheiche achọpụta maka ọrịa ahụ gụnyere ibi aka n'akpa mamịrị nwoke, nyocha ọbara, nyocha kọmputa bụ MRI nakwa ịwa mmadụ ahụ wepụta obere akụkụị ahụ ma nyochaa ya.

Mana o nwere ngosi dị n'ime ahụ mmadụ a ga-ejinwu mara ma ọrịa ahụ apụtala ihe.

NHS kwukwara na ngosi ndị a bụ

  • Ị chọ ịnyụ mamịrị mgbe niile
  • Ị taa ahụhụ mgbe ị na-anyụ mamịrị
  • Ị dị ka ịnyụchabeghị mamịrị
  • Ị hụ ọbara n'ime mamịrị gị

Etu ị ga-esi gbalahụ ya

Tupu ịchọba ụzọ ị ga-eji gbalahụ ya bụ ọrịa, ị ga-ebu ụzọ mara ihe ndị na-ebute ya.

NHS kwuru na dịka ọrịa akpụ dị icheiche, ndị sayensị ebidobeghi aka n'otu ihe a ma ama na-ebute ọrịa a.

Mana ha nyochapụtara ụfọdụ ihe ndị na-eme ka ọrịa ahụ bịa n'ahụ mmadụ ọsịsọ maọbụ mee ka ọ bawanye.

Ha gụnyere:

Afọ ole ị dị - E cheere na ọrịa ahụ na-aka emetụta ndị gafere afọ 50.

Agbụrụ - Nyocha gosiri na ọ bụrụ na ọrịa akpụ akpa mamịrị maọbụ ọrịa akpụ ọbụla dị n'agbụrụ gị, ị ga-enweike ịbute ya.

Nri - Ndị sayensị nwere obere akaebe na-egosi na nri ndị nwekarịrị 'calcium' n'ime ya na-ebute ọrịa a.

Ibu oke ibu- Nyocha gosikwara na ndị buru oke ibu nwereike ibute ọrịa mana n'aka nke ọzọ, imegharị ahụ nakwa iri nri zuroke na-enyeaka ibelata ohere ibute ọrịa a.

Ọtụtụ ndị mmadụ agbakọtabuola ọnụ n'Okpara Square dị n'Enugwu iji mee ngagharịiwe megide ọrịa 'Prostate Cancer'.

'Prostrate Cancer' bụ ọrịa ọjọọ na-adị n'akpa mamịrị ụmụnwoke, bụ nke gburula ọtụtụ ụmụnwoke.

Onye hiwere ngagharịiwe otu "pink blue" ahụ bụ mazị Roncy Chidebe kwuru na ya na ndị otu ya chọrọ ka ụmụnwoke niile teta n'ụra, gaa nyochaa onwe ha.

Chidebe kwuru na Onye ọbụla chọpụtara nke ya n'oge nwere ike igwọta ya tupu ọghọọ Cancer.

Onye ọzọ sokwa chịkọba ya bụ ngagharịiwe bụ Ọkanmụta Peter Ebigbo gwara ụmụnwoke ka ha ghara ịdị na-edị orịa, kama ka ha gaa nyocha ngwa ngwa ha nwere nsogbu inyụ mamịrị.

Ndị mmadụ, ma nwoke ma nwaanyị na-agba ọsọ kwa ụbọchị n'Okpara square soro ndị otu Pink blue gbaa ọsọ ngagharịiwe ahụ.

Ndị dibia bekee nọ kwa ebe ahụ na-ele ndị mmadụ ahụ n'efu.

Onye ọrụ ahụike na-achịkọba ya bụ nyocha Prostate Cancer bụ Nonso Nwosu, nyere ndụmọdụ ka nwoke ọbụla gbara afọ iri anọ ma ọ bụ iri ise gbalịa na-aga ụlọọgwụ kwa mgbe kwa mgbe maka nyocha Prostate Cancer.

Nwosụ kwuru na-achọpụtara ọrịa prostate n'oge, enwereike ịgwọta ya.