Gọvanọ Nwifuru enyela ndị Amasiri ụbọchị atọ iwepụta isi mmadụ anọ ahụ e bepuru n'Okpolojo Oso Edda

Ebe foto si, Rt. Hon. Francis Ogbonna Nwifuru
Gọvanọ Ebonyi Steeti bụ Francis Nwifuru enyela ndị obodo Amasiri dị n'okpuruọchịchị Afikpo ụbọchị atọ ka ha wepụta isi mmadụ anọ ahụ ha beere ma tọhapụ ndị ọzọ ha tọọrọ n'oge ha wakporo obodo Okporojo Oso Edda nke okpuruọchịchị Edda.
Cheta na a wakporo obodo Okporojo Oso Edda gbuo mmadụ anọ ma bere isi ha ebe a na-achọ mmadụ anọ ndị ọzọ achọ, nke mere Gọvanọ Nwifuru jiri chụọ ndị Eze ọdịnala, ndị ji ọkwa dị iche iche n'obodo Amasiri.
Gọvanọ dị na mbụ nye ndị obodo Amasiri iwu ka ha wepụta isi mmadụ anọ e bepuru na mmadụ anọ ndị ọzọ ahụ a tọọrọ n'obodo Okporojo Oso Edda.
Mgbe ọ na-agwa ndị ntaakụkọ okwu n'ụbọchị Mọnde, Gọvanọ Nwifuru kwuru na obi adịghị ya mma etu ndị obodo a si akpa ma gaa n'ihu nye ha ụbọchị atọ iwepụ isi ndị ahụ e bepuru.
Ndị ọzọ so n'ọgbakọ ahụ bụ ndịisi ngalaba nchekwa, ndị ndu ọdịnala, ụmụnwaanyị, ndị ntoroọbịa si n'obodo ihe ndị a metụtara.
Aka akpara ndị Eze ọdịnala abụọ n'ebubo na aka ha dị n'ogbugbu ndị mmadụ n'obodo Oso Edda, Ebonyi Steeti

Ebe foto si, Effium Community Tv.
Ndị uweojii Ebonyi Steeti ekwuola na ha anwụchiela ndị Eze ọdịnala abụọ ndị a na-enyo na aka ha dị n'ogbaghara butere ogbugbu ndị mmadụ n'obodo Okpolojo nke Oso Edda di na steeti ahụ.
Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii n'Ebonyi Steeti bụ Joshua Ukandu kwuru na a nwuchiri onye ọzọ a kpọrọ Anya Baron-Ogbonnia na-ahụ maka mmepe obodo Amasiri maka ogbugbu mmadụ anọ n'obodo Edda.
O kwuru na ndị Eze ọdịnala abụọ a nwuchiri gụnyere Onyeidam Bassey na Godfrey Oko-Obia bụ ndị obodo Amasiri dị n'okpuruọchịchị Afikpo.
Ukandu kwuru na nnyocha na-aga n'ihu ịmata etu aka ndị Eze a si dị n'ogbugbu ndị mmadụ n'obodo Edda.
Ọ gara n'ihu kwuo na ndị uweojii dị na mbụ nwuchie mmadụ iri na mbụ.
O kwuru na ọ bụ mgbakọta aka ndị ọrụ nchekwa uweojii, ndịagha, ndị DSS na ndị Civi Defense ka ha jiri nwuchie ndị a.
Cheta n'ụbọchị Tọzde 29 Jenụwarị, 2026, ụfọdụ ndị na-ebuagha si n'obodo Amasiri wakporo obodo Okpolojo ma bepu mmadụ anọ isii, gbaa ọtụtụ ụlọ ọkụ ma mebie ọtụtụ ngwo ngwo e ji ebi n'ụlọ.
Kamgbe ọtụtụ afọ, ndị obodo Okpolojo nke Edda na obodo Amasiri bụ ndị agbataobi ha na-enwe nsogbu okeala nke buterela ọgbaghara ugboro ugboro.
E tinyere ọnọdụ onye apụtala ezi mpaghara ọgbaghara ahụ

Ebe foto si, Ebonyi Government/screengrab
Gọọmenti Ebonyi steeti amanyela ọnọdụ onye apụtala ezi n'Amasiri dị n'Afikpo maka ọgbaaghara dapụtara na mpaghara ahụ.
Gọọmenti kwuru na ha manyere nke a, gbochie ndị mmadụ ịgagharị maọbụ ịpụta ezi site n'elekere abụọ nke ehihe ruo n'elekere iri nke ụtụtụ echi ya maka ịnweta udo n'obodo ahụ.
Ha mechiri ụlọakwụkwọ niile nakwa ngalaba azụmahịa dị icheiche na mpaghara ahụ.
Cheta na nke a na-eme dịka e bepụrụ mmadụ anọ isi n'obodo a na-akpọ Okporojo, Oso Edda, n'okpuru ọchịchị Edda dị n'Ebonyi steeti.
A na-ebo ebubo na ọ bụ ndị omekome sitere n'obodo a na-akpọ Amasiri kpara mkpamkpa ahụ nke butere ọnwụ ọtụtụ mmadụ n'Okporojo.
Lee ihe na-eso ọnọdụ onye apụtala ezi gọọmenti manyere n'Amasiri

Ebe foto si, Boniface Nwankwo
Gọvanọ Francis Nwifuru manyere ọnọdụ nchekwa ahụ mgbe ya na ndị isi ọrụ nchekwa dị icheiche na steeti ahụ nwechere ọgbakọ.
Nwifuru kwuru na ọgbakọ nchekwa ha nwere kwekọrịtara iwepụ ndị eze ọdịnaala niile n'Amasiri ma chụọ ndị niile na-arụrụ gọọmentị ọrụ n'obodo ahụ maka mkpamkpa kpara.
Ọ sị na ha ekposasịala otu niile dị na obodo ahụ, wepụ ndị isi obodo n'ọkwa ha ma kposaa otu ụmụnwaanyị dị icheiche n'obodo ahụ.
Ọ nyere iwu ka ndị isioche n'okpruru ọchịchị Afikpo, Onicha, Ohaozara, na Ivo ka ha jikọọ aka na-ahụ maka ọchịchị na nlekọta Amasiri.
Gọọmenti Ebonyi wepụtakwara usoro iwu ga-amachi ma kposaa iwu guzobere 'Amasiri Development Centre".
Gọvanọ nyere iwu ka e zipu ndị niile na-arụ ọrụ n'Amasiri Development Centre ma kpọghachị ha azụ na gọọmenti okpuru ọchịchị e si zite ha.
Ha gwara ndị nkuzi niile ka ha gaa n'obodo ndị ọzọ gaa bido ọrụ dịka e mechiri ụlọ akwụkwọ n'Amasiri.
Gọvanọ Nwifuru chuturu ndị Eze ọdịnala, ndị ji ọkwa gọọmentị n'Amasiri n'ọrụ n'ihi mwakpo e mere n'Oso Edda
Akụkọ na-eru anyị ntị ugbua na-ekwu na Gọvanọ Ebonyi steeti bụ Francis Ogbonna Nwifuru achụọla ndị ji ọkwa na gọọmentị ya si obodo Amasiri nakwa eze ọdịnaala ha n'ọrụ maka mkpamkpa kpara na nsonso a n'Okporoja dị n'Oso Edda na steeti ahụ.
N'ụbọchị Tọzde, ndị bu egbe a sị si Amasiri dị na'Afikpo wakporo agbataobi ha bụ ndị Okporoja dị n'Oso Edda, gbuo mmadụ anọ ma sunye ọtụtụ ụlọ ọkụ.
Nwifuru onye kwuru nke a dịka ọ gara ebe ihe mere n'ụbọchị Satọde, nyere iwu ka ndị o metụtara nyefee ụgbọala gọọmenti bunyere ha maka ọrụ ha.
Ndị ọchụchụ n'ọrụ a metụtara gụnyere Kọmishọna na-ahụ maka agụmakwụkwọ dị elu (tertiary education) bụ Ọkammụta Amari Omaka, ndị eze ọdịnaala Amasiri, ndị isi ogbe nakwa ndị isi otu obodo (town union) wdg.

Ebe foto si, Ebonyi Government/screengrab
N'okwu ya, Nwifuru, onye kwuru na o nweghị akụkụ ọ kwunyeere, kwuru na "e kpebiala maka oke ala, nsogbu a ebidoghị taa mana ndị obodo o metụtara ejibeghị ndozi kpọrọ ihe."
Nwifuru enyela ndị ọrụ nchekwa iwu chọta ndị kpara mkpamkpa n'Oso Edda

Ebe foto si, Ebonyi Government
Aka na-achị Ebonyi Steeti bụ Francis Nwifuru enyela ndị ọrụ nchekwa ntuziaka ka ha mee nchọpụta gbasara ihe butere mwakpo e mere ndị Okpuru Ọchịchị Oso Edda dị na steeti ahụ na nsonso a.
Na mgbede ụbọchị Tọzde, ndị bu egbe gburu mmadụ anọ, tọrọ ụfọdụ ndị mmadụ ma sunye ọtụtụ ụlọ ọkụ n'obodo Okpojo dị n'Okpuru Ọchịchị Oso Edda dị n'Ebonyi Steeti.
Nwifuru, onye kwuru na agwa ahụ gosiri 'akwanyeghịrị ndụ ugwu' sịrị: "Enwetara m ozi banyere mwakpo mere na nso nso a n'Oso Edda nke tara isi ndị mmadụ ma bute mbibi akụ na ihe e nwe enwe."
"Agwa a na-emegide mbọ anyị na-agba iweta udo n'ime ime obodo, anyị agaghị anabata ya.
Ndị bu egbe awakpoola Oso Edda n'Ebonyi Steeti, gbuo mmadụ anọ ma tọọrọ ọtụtụ ndị ọzọ

Ebe foto si, Screengrab
Ugbua, i nwereike inweta akụkọ BBC Igbo niile n'ekwenti gị.
Pịa aka ebe a ka i soro anyị
Ebe Ọkwa azụmahịa WhatsApp kwụsịrị
Ndị uweojii Ebonyi Steeti si na ha na-enyocha ogbugbu e gburu opekatampe mmadụ anọ n'obodo Oso Edda dị na steeti ahụ bụ nke a na-eche na ọ bụ nsogbu ala dara n'etiti obodo Oso Edda dị n'Edda na ndị Afikpo dịkwa n'Ebonyi Steeti.
Akụkọ kwuru na ndị bu egbe a sị si Amasiri, wakporo Oso Edda gbupu mmadụ anọ isi, sunye ọtụtụ ụlọ ọkụ n'abalị Tọzde 29 Jenụwarị, 2026.
Kọmịshọna steeti ahụ na-ahu maka nchekwa obodo bụ Ichie Etta Udeh kwuru na ya bụ ihe mere n'ezie ma sị na e tinyela ndị nchekwa na obodo ahụ.
Ọ sịrị, "Ọ bụ ihe mere eme, n'ebe elekere ise nke mgbede ụbọchị Tọzde, a kpọrọ m oku, gwa m na ndị agboro gara na obodo Oso Edda gbuo mmadụ anọ."
N'otu aka ahụ, ọnụ na-ekwuru ndị uweojii steeti ahụ bụ Joshua Ukandu gwara BBC n'ekwentị na ya bụ ihe bụ ihe ọ kpọrọ "esemokwu ala dịarala ọtụtụ afọ" tara isi mmadụ atọ ozigbo, ebe otu onye merụrụ ahụ nwụrụ n'ụlọgwụ n'ụtụtụ Fraide.
"O mere ebe elekere asaa nke mgbede"
Cheta na obodo abụọ a gbara onwe ha agbataobi na-ese ọkwụ ala nke tarala isi ọtụtụ mmadụ.




























