Mary Habila gwara enyi ya nwoke na imi ya na-agba ọbara- Dave Umahi

Dave Umahi bụ Mịnịsta na-ahụ maka ọrụ na Mary Habila a sị nwụrụ n'ụlọ ya na ụzọ edobeghị anya

Ebe foto si, Dave Umahi/ Mary Habila

Mgbe e biputara ya
Oge e ji agụ akụkọ nkeji 7

Mịnịsta na-ahụ maka ọrụ na Naijirịa bụ David Umahi ekwuola na tupu Mary Habila anwụọ, na ọ gwara enyi ya nwoke na ọbara na-agba ya n'imi.

Nke a bụ mbụ Ụmahi na-ekwu okwu banyere nwata nwaanyị ahụ gbara afọ 26 a sị so na ndị ọrụ ahụike ya nke nwụrụ n'ụlọ Ụmahi n'Ebonyi Steeti n'abalị 27 nke ọnwa Juun afọ 2026 n'ụzọ edobeghị anya nke mere okwu ọnwụ ya ghọọ okwu a kpụ n'ọnụ na Naịjiria kemgbe abalị ole na ole gara aga.

N'okwu ya dịka ọ na-agwa ndị ntaakụkọ okwu ụbọchị Tọzde, Ụmahị sịrị na,

"Ọ(Mary) gwara enyi ya nwoke okwu tupu ọ nwụọ, sị na imi ya na-agba ọbara.

"Mana enyi ya nwoke gwara ya(Umahi.) .

"Nwata nwoke ahụ gwara ya sị, " Agaghị m aga n'ihu mụ na gị na-ekwu ụka ebe imi gị na-agba ọbara, n'ihi na o nwere ike ime ka ihe na-eme gị kawanye njọ."

" Mana Mary rịọ ya ka ọ ghara ịgbanyụ ekwentị ya, Nwta nwoke ahụ gbanyụrụ ekwentị ya ma kpọghachi ya ka nkeji at ọ gafere mana ọ zaghị ekwentị ya."

Umahi kwuru na ọ bụ ndị ogbo nwata nwaanyị ahụ hụrụ ozu ya ka ọ nwụchara .

"E si n'ime gbachie ọnụ ụlọ ebe o hiri nke mere ka a gbawaa ụzọ ahụ ma hụ ya n'ozu dịka 'mmiri ka na-gba n'ọnụ ụlọ ahụ.

"Ọ kpọchiri ọnụụlọ ya. Ọ bụ n'ụtụtụ echi ya oge ahụghị ya, ka a gbawara ụzọ, hụ na mmiri na-agba."

Ọ gara n'ihu sị," Ihe na-atụ m n'anya bụ na ihe meehala n'obodo, e were ya mee ihe ndọrọndọọ ọchịchị."

Enyi Mary Habila akọwala ihe mere tupu ọnwụ ya
Anita Baaki na Mary Habila

Ebe foto si, Anita Baaki/Facebook

Gafere Ọkwa azụmahịa WhatsApp ma gaa n'ihu na-agụ
Anyị nọ na WhatsApp

Ugbua, i nwereike inweta akụkọ BBC Igbo niile n'ekwenti gị.

Pịa aka ebe a ka i soro anyị

Ebe Ọkwa azụmahịa WhatsApp kwụsịrị

Enyi na onye ọrụ ibe Mary Habila, bu Anita Baaki, akọwala ihe ikpeazụ o hụrụ tupu Habila anwụọ.

Baaki, onye bụ ọkachamara n'ịgwọ ọrịa site n'ịgbatị akwara, kwuru nke a n'akwụkwọ iyi ọ ṅụrụ n'ihu Ụlọikpe Ukwu nke Ebonyi n'Ụbọchị Wenezde.

Baaki, onye si Benue steeti, kwuru na ya na Habila na ndị ọrụ ọzọ nke ụlọọrụ Federal Ministry of Works si Abuja gaa Ebọnyi steeti na 24 Juun 2026 maka ọrụ gọọmenti n'okpuru Minista na-ahụ maka Ọrụ bụ David Umahi.

Ọ sịrị na e debere ha n'ụlọ e nyere ndịọrụ ministri na ndị ha na ha na-arụkọ ọrụ n'obodo Uburu, nke dị na mpaghara ọchịchị Ohaozara.

O kwusiri ike na chalet ahụ bụ maka ndịọrụ ministri, ọ bụghị ụlọ obibi nke Umahi.

Dị ka Baaki si kwuo, oge ikpeazụ ọ hụrụ Habila ndụ bụ na mgbede 26 Juun, mgbe Habila si n'ebe e mere ya isi lọta.

Ọ kwuru na Habila batara n'ọnụ ụlọ ya iji gosi ya isi ọhụrụ ya, ha wee kparịta ụka ma chịa ọchị.

Baaki kwuru na Habila gwara ya na ike agwụla ya nakwa na ọ chọrọ ịsa ahụ tupu ọ lakpuo ụra.

N'echi ya, Baaki kwuru na obi malitere ịgba ya n'ihi na Habila apụtaghị n'ọnụ ụlọ ya dịka ọ na-emebu. Ọ gara kụọ aka n'ụzọ, mana enweghị onye zara ya, ebe ọnụ ụlọ ahụ ka kpọchiri n'ime.

Ọ sịrị na mgbe ha chọchara Habila n'ebe ndị ọzọ ma ha ahụghị ya, ndịọrụ ndị ọzọ mepere ụzọ ahụ n'ike, ebe ha hụrụ ya ka ọ dina n'ala n'akụkụ ọnụ ụzọ ụlọ ahụ, amaghị onwe ya.

A kpọgara ya ozugbo na David Umahi Federal University Teaching Hospital, ebe ndị dọkịta kwupụtara na ọ nwụọla tupu ebute ya.

Baaki kwuru na o na enye nkwupụta ahụ n'enweghị onye manyere ya, iji nyere ndị na-eme nchọpụta aka ịmata ihe kpatara ọnwụ Habila.

Aha onyonyo, Mary na-arịa 'hormonal imbalance tupu ọ nwụọ - Francis Nwaze
Mary Habila: Ihe nnyocha mbụ anyị merela gosiri- Ndị uweojii
Mara Habila

Ebe foto si, Mara Habila / Facebook

Ndị uweojii Ebonyi steeti ekwuola ihe ha ma banyere nwata nwaanyị nwụrụ na ngwuru Dave Umahi na nsonso a.

Mary Habila gbara afọ 26, nwụrụ na ngwuru Dave Umahi bụ Minista na-ahụ maka ọrụ nke Naijiria n'abalị 27 nke ọnwa Juun, afọ 2026.

N'ozi ha wepụtara n'ụbọchị Wenezde, abalị 15 nke ọnwa Julaị, afọ 2026, nke ọnụ na-ekwuru ha bụ Joshua Ụkandu binyere aka, ndị uweojii kwuru na ' Habila na ogbo ya ya na ya nọ n'otu ndị ọrụakụike so Umahi arụụ ọrụ soro ụmahị gaa n'obodo ya dị na 'Uburu ebe nwada ahụ nwụru n'ọnụmara dị nna ngwuru be Umahi."

Ozi ahụ gara n'ihu na ha agala ebe ihe ahụ mere, nakọtala nkwupụta n'aka ndị metụtara okwu ahụ, ma na ha chọrọ ka ọkachamara n'inyocha ozu 'pathologist' n'asụsụ bekee, mee nyocha ozu iji chọpụta kpọmkwem ihe kpatara ọnwụ ya.

Ha kwuru na, n'agbanyeghị na ezinaụlọ Habila kwuru na ha achọghị ka e mee nnyocha ozu ahụ, ha kwenyere na ọ dị mkpa n'ihi mgbagwoju anya so ya bụ okwu.

HA kwuru na ha na-eche ka ndị ezinaụlọ maọbụ onye ha họpụtara bịa tupu e mee ya.

Ndị uweojii kwuru na ha ga-eme nyocha ahụ n'ụzọ doro anya, n'enweghị ịkpa oke, ma kwere nkwa na ha ga na-eme ka ọha mara ihe ọhụrụ ọbula gbasara okwu a ka nyocha na-aga n'ihu.

Mary Habila abụghị onye otu anyị- otu 'Nigeria Physiotherapy Society'

Mary Habila ji akwa ojii ma gbara ọlaonu na-acha ọcha.

Ebe foto si, Mary Habila/Facebook

Otu jịkọrọ ndị ọrụ ahụike na-ahụ maka ịgbatị akwara a kpọrọ, 'Nigeria Physiotherapy Society'(NPS) ekwuola na Mary Habila adịghị n'akwụkwọ ndị ọgbaatịakwara nke Bekee kpọrọ 'Physiotherapist.na Naijiria.

Mary Habila gbara afọ 26, nwụrụ na ngwuru Dave Umahi bụ Minista na-ahụ maka ọrụ nke Naijiria n'abalị 27 nke ọnwa Juun, afọ 2026.

Nke na-abịa dịka Umahi kpọburu Habila ' onye ọrụ mgbatị akwara" n'ozi mgbasaozi o wepụtara banyere nwaagbọghọ.

Mana otu NPS kwuru sị, " Nnyocha anyị nyochara akwụkwọ ndekọ aha ndị ọrụ mgbatiakwara egosịghị aha 'Mary Habila."

Ihe anyị ma maka nwagbọghọ a sị nwụrụ na ngwuru Dave Umahi

Ọtụtụ ndị mmadụ na otu dị iche iche akpọọla oku ka e nnyocha ihe gburu otu nwata nwaanyị a sị nwụrụ n'ụlọ Minista na-ahụ maka ọrụ bụ Dave Umahi n'Ebonyi steeti.

Akụkọ na-efegharị na soshal midia boro ebubo na Mary Habbila na ogbo ya bụ Anita Baski gara n'ụlọ Umahi n'Uburu dị n'Ebonyi steeti n'abalị 26 nke ọnwa Juun afọ 2026 bụ ebe a sị na Mary nọ nwụọ.

Mana a hụrụ Mary n'ime ụlọ ebe ọ dịghịzị eku ume n'ihe dịka echi ya bụ Juun 27, 2027.

Ajụjụ a na-ajụ maka ọnwụ Mary Habbila

David Umahi na Mary Habila

Ebe foto si, Dave Umahi/X

Ọnwụ onye ọrụ ahụike bụ Mary Habila bụ okwu a kpụ n'ọnụ na Naịjiria ugbua dịka akụkọ banyere etu o siri nwụọ n'ụlọ Mịnịsta na-ahụ maka ọrụ bụ ihe na-agbagwoju anya.

Mary Habilla, onye Nok dị na Kaduna steeti bụ onye na-arụ ọrụ n'ụlọọgwụ, "Dave Umahi Federal University of Health dị n'Uburu, Ebonyi steeti, mana e zigara ya ka o bido ọrụ na-arụ Mịnịstrị na-ahụ maka ọrụ nke nke Dave Ụmahụ bụ Mịnịsta na-elekọta ya, dịka ọnụ na-ekwuru Ụmahi bụ Francis Nwaze sị kọwaa.

Akụkọ na-efegharị na soshal midia kwuru na Mary nwụrụ n'ụlọ Dave Umahi, mana Nwaze gwara BBC na ọ bụghị n'ụlọ Dave Umahi ka Mary nwụrụ kama na ọ bụ n'ebe ndị ọrụ na-ebi nke a kpọrọ "quarters" ka ọ nọ nwụọ.

Kedụ ihe gburu Mary?

Ajụjụ ọzọ ọha kpụ n'ọnụ bụ ihe gburu mmeri dịka ọtụtụ na-ekwu banyere ọnọdụ ahụrụ ozu ya n'ihe onyonyo fegharịri na soshal midia nke gosiri ebe nwaagbọghọ ahụ eyighị akwa.

Mana Nwaze kwuru na ndị mmadụ gbawara ụzọ hụ ozu Mary dịka a a chọrọ ya , a hụghị ya, were hụ ya ma buga ya ụlọọgwụ.

Ọ kọwara n'ihe onyonyo na-efegharị bụ nke e setara n'ụlọozu ebe a dọwara ozu ya na ọ bụghị ka ọ dị n'ụlọ ebe a hụrụ ya.

Nwaeze gwara BBC na Umahị anọghị mgbe Mary nwụrụ, ma kwuo na a gwara Umahi agwa maka ọnwụ Mary. Ọ gara n'ihu kwuo n'ihu kwuo na Mary na-arịabu ahụ tupu ọ nwụọ nke enyi yan woke makwa maka ya

Nwaeze ji ohere ahụ kwuo ihe ọ ma na-eme Mary tupu ọ nwụọ na-arịa ihe Bekee kpọrọ 'hormonal imbalance'.

N'okwu na ezinaụlọ Mary ekweghị ka e me nnyocha ozu nwata nwaanyị ahụ maọbụ gwa ndị ntaakụkọ okwu maka ya n'ihi egwu.

Nwaze sara sị na nke a bụghị eziokwu dịka o kwuru na Umah dị njikere ime nke bekee kpọrọ 'Autopsy" iji chọpụta ihe gburu Mary.

Mary Habila yi akwa ojii

Ebe foto si, Mary Habila/Facebook

Ihe ndị uweojii kwuru maka okwu a

Oge BBC kpọtụrụ ndị uweojii n'Ebonyi steeti , ọnụ na-ekwuru ha bụ Joshua Ukandu gwara BBC na ha nwetara mkpesa banyere ya bụ okwu ma kwukwaa na ha amalitela nnyocha maka ọnwụ Mary Habila.