Ebonyi state news: Gọvanọ Umahi akatọọla ogbugbu na mmebi ngwongwo n'Ebonyi steeti

Gọvanọ Dave Umahi nke Ebonyi steeti

Ebe foto si, Francis Nwaeze

Gọvanọ Dave Umahi akatọọla ọgbaghara butere ịgba ụlọọrụ ndị uweojii ọkụ n'obodo Akaeze, Okpuruọchịchị Ivo dị n'Ebonyi steeti.

Ka ọ garuru ebe ihe mere, Umahi kwuru na ọ dịghị mma na ndị ntorobịa mebichara ihe ma kpaa mkpamkpa butere ọnwụ ụfọdụ ndị.

Ọ katọrọ ọkụ ndị ntorobịa a mere ngagharịiwe n'ụtụtụ Mọnde, Jenụwarị 24, gbakwara ụlọ onyeisi okpuruọchịchị Ivo nakwa ụlọ ndị ọzọ dị nso ebe ahụ.

Umahi gara n'ihu kpọọ oku ka a nwuchie ndị a hụrụ n'ihe onyonyo (fesara na soshal midia) ka ha ji anyaike na-epe mmadụ ibe ha.

N'olu ya, ọ sị "Ihe ndị mere n'ogbe a na-ewute m nke ukwuu. Nke mbụ, ana m akatọ ihe onyonyo fesara na soshal midia nke gosiri ebe mmadụ ji anyaike epe mmadụ ibe ya.

Ebe m kwụ bụ na ndụ dị asọ, nke bụ na ndị mere ihe ahụ, ma ha anọ na gọọmentị, ma ha abụ n'Ebube Agu, ma ha abụ ndị ọnụ na-eru n'okwu, a ga-akpọpụ ha ụlọikpe ozugbo.

Enweghi ihe ọbụla kwesịrị ime ka mmadụ ghara ime ihe iwu obodo kwadoro. N'ikpeazụ, anyị ga-asa asịsa n'aka Chineke."

Agaghị ekposa Ebube Agu n'Ebonyi

Umahi kwuru na agaghị ekposa Ebube Agu n'ihi nke a.

O kwuru sị "Ọ dị mkpa ka a mara na Ebube Agu bụ otu iwu obodo kwadoro, nke bụ na agaghị ekposa ya. Mana onye Ebube Agu ọbụla dara iwu ga-ata ahụhụ so ya.

Iwu gbasara Ebube Agu doro anya, dịka e nwere ụfọdụ ndị ọjọọ n'otu nchekwa ndị ọzọ nakwa n'obodo, e nwekwara ike inwe ndị ọjọọ n'Ebube Agu mana ihe m na-ekwu bụ na a ga-achọpụtarịrị ndị ọjọọ ahụ ma wepụ ha.

Ebube Agu na-arụ ezigbo ọrụ, ha na-enyere ndị ọrụ nchekwa aka, mana anyị nwere usoro, nke bụ na iwu kwadoro ha ịnwụchi mmadụ mana ebe ọ kwụsịrị bụ na ị ga-enyefe onye ahụ n'aka ndị uweojii ozugbo.

Ọ dịghị gị n'aka ịta ha ahụhụ ka ọ fọdụzịa igbu ha egbu, i nwere ike ịzọ isi onwe gị, mana ihe akaebe ga-egosirịrị na bu ụzọ nwaa ihe ndị ọzọ mana isi gị apụtaghị.

Ya mere na ihe mere ebe a adịghị m mma n'obi. A ga-anwụchiri mmadụ asaa bu ihe a n'isi ma kpụpụ ha ụlọikpe.

Ka m dọọ ndị ntorobịa aka na ntị maka ime ihe iwu akwadoghi, ha gbuo mmadụ o rute m aka, m ga-ebinye aka n'akwụkwọ ọnwụ ha."

Ndị Ebube Agu gburu nwaokorobịa n'Ebonyi, nke butere ngagharịiwe

Ndị uweojii kwuru na ọ bụ eziokwu na otu nwoke nwụrụ n'aka ndị Ebube Agu.

Ọnwụ nwoke ahụ (bụ onye e boro ohi) n'aka ndị Ebube Agu mere ka ndị ntorobịa n'obodo Akaeze dị n'okpuruọchịchị Ivo n'Ebonyi steeti, mee ngaghariiwe n'ụbọchị Sọnde, Jenụwarị 23, 2022.

Akụkọ kwuru na ndị otu Ebube Agu jichiri nwoke ahụ aha ya bụ Nnaogo Akpoke Anyim, n'ụbọchị Tuzde, abalị 18 nke ọnwa Jenụwarị 2022, ma taa ya nnukwu ahụhụ nke butere ọnwụ ya.

Onyonyo ebe a na-ata nwa okorobịa ahụ ahụhụ gbasara na soshal midia.

Nke a mere ka ọtụtụ ndị ntorobịa mee ngagharịiwe n'ụbọchị Sọnde, abalị iri abụọ na atọ nke Jenụwarị, ma mebie ọtụtụ ihe.

Ha wakpokwara ụfọdụ ndị ọrụ Ebube Agu nakwa ndị niile ha kwuru na aka ha dị n'ọnwụ nwa okorobịa ahụ.

Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii n'Ebonyi steeti bụ Loveth Odah katọrọ ya bụ ihe ma kwuo na "onweghị onye ọbụla nwere ikike iwepụ ndụ mmadụ, n'agbanyeghị ebubo ọbụla e boro ya."

Odah kwuru na ndị uweojii anaghị akwado ndị mmadụ iweghara iwu n'aka onwe ha, kama ọ dị mkpa ka a kọsara ndị uweojii ma ihe dị njọ.

Etu e si gbuo ma bepụ otu onye Ebube Agu isi n'Ebonyi steeti

N'akụkọ dị ka ibe ya, n'otu Ebonyi steeti ahụ, ndị ojiegbe amaghị ndị ha bụ gbagburu ma bepụ isi otu onye ọrụ nchekwa 'Ebube Agu', n'Ebonyi steeti.

Ndị nchekwa Ebubeagu
Nkọwa foto, Ndị nchekwa Ebubeagu

Akụkọ kwuru na ndị ojiegbe ahụ ruru ise mabatara n'ụlọ nwoke ahụ a kpọrọ Sunday Nwafor n'abalị, ebe ha nọ gbagbuo ya.

Loveth Odah bụ ọnụ na-ekwuru ndị uweojii na steeti ahụ , kwuru na ọ bụ eziokwu na ya bụ ihe mere n'obodo Ekpelu dị n'okpuruọchịchị Ikwo dị na steeti ahụ.

Odah kwuru na onyeisi ndị uweojii n'Ikwo kọwara ihe mere na etu Nwafor a na-eche dị ebe afọ iri atọ, si zute ọnwụ ya.

N'olu ya, "Nwunye Nwafor gwara ndị uweojii na tupu ọ nụ ụda egbe, ọ nụrụ ebe otu n'ime ndị omekome na-agwa di ya na ọ hapụrụ n'ime ọhịa ma laghachi n'ụlọ ya ebe ọ na-anara gọọmentị puku naịra iri atọ (N30,000) na-eri."

O kwukwara na aka akparala mmadụ abụọ n'ime ndị omekome a, ebe a ka na-ama imi n'ala inyochapụta etu ya bụ ihe si gaa.

Odah kwuru na nke a emeela ya onye Ebube Agu nke abụọ a na-egbu n'ime ihe ruru izu abụọ, dịka e gburu ma gbaa otu ọkụ nso nso a.

Ọ gara n'ihu kwuo na Kọmishọna uweojii steeti ahụ akatọọla ya bụ ogbugbu ma kwe nkwa ịnwuchi ndị kpara mkpamkpa a.

Kedụ ndị bụ Ebube Agu?

Ebube Agu bụ otu nchekwa ndị gọvanọ mpaghara Ọwụwa Anyanwụ hibere iji buso nsogbu nchekwa dakwasịrị mpaghara ahụ agha.

E hibere ha n'ọnwa Epreelụ, afọ 2021, ka ndị gọvanọ Ọwụwa anyanwụ ndị na ndị isi ọrụ nchekwa mechara nzukọ n'Owere, Imo steeti.

Isi ụlọọrụ ha dị n'Enugwu steeti, ebe ha si achịkọta ndị otu ha ndị nọ na steeti ndị ọzọ.

Mgbe Gọvanọ Dave Umahi nke Ebonyi steeti na-ehibe otu Ebube Agu nke steeti ya, o kwuru sị "Ọ bụ Ebubeagụ ga-enyere onyeisiala Muhammadu Buahri aka maka ọrụ ya na nchekwa n'Ọwụwa Anyanwụ".

Aha onyonyo, 'Ebube Agu' ọ ga-ebute mgbanwe ọnọdụ nchekwa n'Ọwụwa Anyanwụ?