Ebonyi state: Ihe mere steeti a ji bụrụ "elelịa nwa ite"

- Onye dere ya, Chris Sanctus Okereke
- Ndị mere akụkọ a, Broadcast Journalist
Ị ma na Ebonyi steeti nwere ọtụtụ ihe ndị ga-eme gị kwata ma biri ebe ahụ?
Kedụ ihe ọjọọ ndị ị nụrụla maka steeti a e kere n'afọ 1996?
Ị nụrụ na ha "na-ewe iwe ọkụ"? Ka ị nụrụ na "ịgba bọy na-amasị ha" "ha enweghi mmiri"?
Ụfọdụ nwere ike ikwenye n'akụkọ ndị a, mana eziokwu bụ na Ebonyi nwere ihe ọma ga-eme ka ị gaa na steeti ahụ ugboro ugboro.
Ihe ndị a ga-eme ka Ebonyi steeti bụ "ọdụ nwa n'ala Igbo" gụọ gị agụụ:
1) Ha bụ "nkata nri" Ala Igbo:
Ị chọọ ịgaru Ebonyi steeti, mara na ị ga-akwado akwado, mepee afọ gị maka iji nri afọju ya.
Ọrụ ugbo doro ha anya, mere ka nri bụrụ "gbanyụ" ma ghara ịbụ nsogbu nye ha.
A bịa na osikapa, ha bụ "eze".
Ị chọkwaa nnu ị ga-eji eme ka nri gị tọọ ụtọ, Ebonyi ga-enyekwa gị nke a.
Ị hụla ji ha na-akọ? Ụfọdụ na-aha ka aka "ndị nne maama".
Echefukwala ịjụ ese ofe egburegbu ndị Edda ma ị garuo.
2) Ha bụ ndị obiọma na ndị obi umeala:
Ndị Ebonyi ma etu e si anabata mmadụ n'agbanyeghi ebe i si.
Ọtụtụ n'ime ha bụ ndị obiọma, ilekọta mma anaghị eche ha uche.
Ị che na ọ bụ asị? Ngwanu kedụ etu ị ga-esi kọwaa ihe mere Ugochukwu a ma ka "gala boy" si were ihe ọ na-ere nye ndị nga ọ hụrụ n'ụzọ?
3) Ụzọ dị na steeti ha bụ saraa:
Elezighi anya, okporoụzọ dị n'Ebonyi steeti, ọkachasị isiobodo ha bụ Abakaliki, nwere ike ịbụ nke kacha mma na mpaghara ọwụwa-anyanwụ Naịjirịa.
Ọtụtụ ndị Ebonyi na-ekwuzi na ọ dị ka "small London".
4) Omenala ha na-atọwa ntị:
Emume dị ka ịgba mmọnwụ na omenala ndị ọzọ na-agara ha aka ọfụma.
Ị nụla maka Olo nakwa Oke Nkwa? Kedụ maka Nkwa Ụmụagbọghọ? Jụọ onye si Ebonyi steeti. Ọ ga-akọwara gị.
Ọ gụọla gị agụụ ugbua?















