2019 Election: Ndị ntorobịa a chọrọ ịzọ ọchịchị n'Ebonyi steeti

Eze Scholar na Chukwuorji Igodo

Ebe foto si, Eze Scholar/Chukwuorji Igodo

Ọtụtụ ndị ntorobịa na Naịjirịa apụtala ịzọ ọchịchị na ngalaba dị icheiche maka iwu gọọmenti etiti binyere nke hazigharịrị afọ ndị nọ n'ọchịchị dị icheiche dị.

BBC Igbo gwara ụmụ Igbo ka ha zite ndị dị afọ 18-40 chọrọ ịzọ ọchịchị n'afọ 2019 n'elu soshal midia.

Lee ndị gwara BBC Igbo na ha chọrọ ịzọ ọkwa ọchịchị n'Ebonyi steeti na ntuliaka 2019.

Ụfọdụ ndị ntorobia chọrọ isonye na ndọrọndọrọ ọchịchị zitere aha ha ka a gbaa ha n'anwụ ka ọha nwee ike mata ha.

Ụlọomeiwu ukwu

Ezaka Caesar Okwudili dị afọ 38 gụrụ 'Banking and Finance' na mahadum.

Ọ chọrọ ịnọchite anya ndị Ebonyi Sentraal n'ụlọomeiwu ukwu.

Ezeaka Caesar

Ebe foto si, Ezaka Caesar

Ụlọomeiwu nta

Eze Scholar dị afọ 31 bụ ọkaiwu.

Ọ bụ onye Afikpo chọrọ ịnọchite anya ndị Afikpo Nọt/Sawụtụ n'ụlọomeiwu nta.

Eze Scholar

Ebe foto si, Eze Scholar

Ụlọomeiwu nke steeti

1. Chukwuorji Igodo dị afọ 31 bụ ọkaiwu.

Ọ bụ onye Ivo chọrọ ịnọchite anya ndị Ivo n'ụlọomeiwu nke steeti

Chukwuorji Igodo

Ebe foto si, Chukwuorji Igodo

2. Agwu Chijioke Agwu dị afọ 31 bụ onye ntaakụkọ.

Ọ bụ onye Amagu Anike Ọnịcha chọrọ ịnọchite anya ndị Ọnịcha Westị n'ụlọomeiwu nke steeti.

Agwu Chijioke Agwu

Ebe foto si, Agwu Chijioke Agwu

3. Omenka John Michael dị afọ 28 bụ onye achụmntaego.

Ọ bụ onye Ohaozara chọrọ ịzọ oche n'ụlọomeiwu nke steeti.

Omenka John Michael

Ebe foto si, Omenka John Michael

N'afọ 2018 a ka onyeisiala Naịjirịa bụ Muhammadu Buhari binyere aka n'akwụkwọ ga-eme ka ndị ntorobịa Naịjirịa nwee ohere ịzọ ọkwa ọchịchị.

Akụkọ ga-amasị gị