Premier League title: Man City amaburula iko mere Liverpool ọnọ nso eru aka

Ebe foto si, Getty Images
Manchester city emeriela English Premier League nke izu 2018/2019 dịka ha merichara Brighton na Hove Albion ọkpụ anọ asatara otu.
City gbagoro n'ogo nke mbụ tebulu Premier League dịka ha ji otu pointi gafee Liverpool n'ọzị n'ogo abụọ.
Nke a ga-eme ya mmerị anọ nturu ugo Premier League Man city na-enweta kamgbe afọ 1992.
Ha bụkwa otu egwuregwu merigoro n'usoro n'usoro ọkwa Premier League kamgbe afọ iri gafechara.
Ilkay Gundogan,Riyad Mahrez,Aymeric Laporte nakwa Sergio Aguero nyere goolu anọ ndị Mancity ji merie Brighton bụ otu bụ ụzọ nye goolu.
Mmeri mekwara ka Liverpool bụrụ na-ele anya ma ha ga-enweta ya bụ ọkwa n'izu ọzọ na-abịanụ dịka ha ji ọkpụ abụọ asataghị otu merie Wolves.
Iko premier League akwaala Liverpool nke afọ 29.
Ikuku Man Utd amaala n'ọnya Cardiff

Ebe foto si, Getty Images
Manchester bụ enyi ama ama azọpụtaghị onwe ha n'aka Cardiff dịka ha gbara ha ọkpụ goolu abụọ asataghị otu.
Nathaniel Mendez-Laing pianyere goolu abụọ nyere Cardfiff mmeri ebe onye nche goolu Cardiff bụ Neil Etheridge gosiri na ọ bụ dike site n'igbochi goolu niile ndị United gbara mbọ inye.
Otu Arsenal nwakwara oke ha site n'iji ọkpụ goolu atọ asatara otu merie Burnley .
Chelsea na Leicester mara aka mana o nweghị onye nyere ibe ya ọkpụ goolu.











