Man City vs Tottenham: Man City agbarala isi onwe ha

Manchester City

Ebe foto si, Getty Images

Manchester City na Tottenham nwalere onwe ha ọzọ taa mana nke a bụ n'asọmpi Ịnglish Premier League.

Ajụjụ ọtụtụ mmadụ na-ajụ bụ "Man City ọ ga-eji iwe mgbapụ Tottenham gbapụrụ ha n'asọmpi Uefa Champịọns merụọ ha ahụ na nke Premier League?"

Ka ha a ga-anọ na mmiri ncha aba ha anya ọzọ?"

N'iji zaa ajụjụ nke mbụ, Man City n'egbughi oge sụnyere goolu ha na nkeji 5 site n'aka Philip Foden, nke a bụ goolu mbụ nwa amadị a na-enye n'asọmpi Premier League.

Oke ihe mere Man City mgbe onye otu egwu ya bụ Kevin de Bryune gbara ụkwụ ọcha n'ikpere n'ime nkeji 38 nke mere e ji wepụ ya.

Ndị otu egwuregwu abụọ ndị a kere nkwụcha rue na nkeji 45 mgbe agba nke mbụ gwụrụ.

Dịka agba nke abụọ malitere, ọ dịka a ga-asi na Man City chakere ọkụ mana Tottenham ekweghị ha nyee goolu ọzọ.

N'otu aka ahụ Tottenham nwakwara ike Man City ọtụtụ oge mana ọ mịtaghị mkpụrụ rue oge asọmpị ahụ gwụrụ na nkeji 90.

Mmeri a Man City ji otu ọkpụ merie Tottenham nyere ha ohere ịlaghachị n'isi tebụlụ Premier league n'ọnụọgụgụ 86.

Ha ji otu ọnụọgụgụ karịa Liverpool bụ ndị nọ na 85.

Akara ntụ-ntụ

Akụkọ ndị ga-amasị gị: