Aka m Atiku gụọ akwụkwọ- Buhari

Oge e ji agụ akụkọ nkeji 4

Aka m Atiku gụọ akwụkwọ-Buhari

Buhari, Atiku

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Onyeisiala Buhari na Atiku Abubakar ga-akwata na ntuliaka onyeisiala na 2019

Onye ọkaiwu ma bụrụkwa onye na-eru n'okwu n'ihe gbasara ndọrọndọrọ ọchịchị bụ Goddie Uwazuruike ekwuola n'okwu gbasara aka onyeisiala Muhammadu Buhari na-ama Atiku n'ebe agụmakwụkwọ ha abụọ dị bụ akụkọ ajembele iji wepụ anya n'okwu dị mkpa gbasara ka ntuliaka 2019 siri gaa.

Onyeisiala Muhammadu Buhari mara Atiku Abubakar nke PDP aka n'ihu sị ka o wepụta asambodo akwụkwọ ndị ọ sị na ọ gụrụ dịka ọ na-ekwu na ya bụ Buhari ka Atiku n'ịgụakwụkwọ nakwa ịma nke ụbọchị na-akọ.

Nke a na-eme dịka PDP na Atiku gbara Buhari akwụkwọ n'ụlọikpe na-ekwu ka a kagbuo mmeri Buhari na ntuliaka 2019 ma na-ekwu na Buhari enweghị asambodo sekọndrị dịka o siri tinye n'akwụkwọ.

Na mkparịtaụka ya na BBC nwere n'ekwenti, Uwazuruike kwuru na ," Ọ bụ ịgba egbe ọnụ" ka Buhari na-agba iji wepụ ndị mmadụ anya n'okwu dị mkpa a kpụ n'ọnụ.

"Atiku abịala kwuo na ọ bụ meriri na ntuliaka 2019, Ihe onye na-achị achị kwesịrị ikwu bụ 'mba, ọ bụ mụnwa bụ Buhari meriri.' ị gosikwa etu isi merie.

Uwazuruike onye bụ bu onyeisi Aka Ikenga gara n'ihu sị, "Mana ị bịa na-akọ ihe ndị ọzọ enwnweghị isi, ọ bụ ịmarụ ọnụ.

Ekwuo elu kwuo ala, ihe anyị chọrọ ịma bụ onye meriri na ntuliaka 2019."

Nke a bụ isiokwu ikpe a, ya ka ndị mmadụ na-atụanya.

Iwo Road

Otu tanka bu mmanụ agbịdị tiwara gbaa ọkụ n'okporoụzọ Lagos n'Ibadan n'ehihie ụbọchị Tọzde.

Ndị ọrụ gbatagbata ebe ha na-amịnyụ ọkụ n'okporo ụzọ
Nkọwa foto, Mmadụ abụọ regburu n'ime ọkụ a

Akụkọ na-ekwu na ndụ mmadụ abụọ efuola ha maka ọkụ a.

A na-eche na ọtụtụ mmadụ merụrụ ahụ na ya bụ ọdachị mana amabeghi ezi ọnụọgụgụ ya.

Ebe ọkụ gbara n'Ibadan
Nkọwa foto, Ụgbọ ndị ọkụ a metụtara n'okporoụzọ Legọs na Ibadan

Ndị mmadụ nọ ebe ihe mere kọwara na o teela aka ọkụ a na-agba tupu enyemaka erute ha nso.

gwọ opekatampe.

Onyeisiala Muhammadu Buhari

Ebe foto si, @BashirAhmed/Twitter

Onyeisiala Buhari etinyela aka n'akwụkwọ iwu ga-eme ka ndị ọrụ Naịjirịa bido ịnata puku naira iri atọ dịka ụgwọ opekatampe.

A na-atụ anya na ụgwọ ọhụrụ a ga-ebido ozugbo ozugbo n'ime ihe dịka ọnwa Mee.

Cheta na otu dị icheiche na-agbagha ego ole ụgwọ opekatampe ga-abụ tupu e kweta na puku naira iri atọ.

Onyeisi ụlọomeiwu bụ Bukola Saraki tinyere ọnụ n'okwu a site n'akara Twitter ya.

Skip X post, 1
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post, 1

N'egwuregwu

Super Falcons na France

Ebe foto si, NFF/twitter

Nkọwa foto, Chikwelu Oparanozie bụ onye ndụ ndị Falcons na ya bụ egwụrụegwụ

Erela ihe karịrị ọkara na tiketi niile e dobere maka asọmpị iko mba ụwa ụmụnwaanyị ga-eme n'afọ 2019 a.

BBC ghọtara na asọmpị dị n'etiti Nigeria na Fransị so na ndị erechara ere. Ị ka na-eche gịnị?

Akụkọ BBC Igbo na nkeji

Aha nkeananụānụ, Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile

Assest Declaration : Onnoghen ga-ama ebe ọ kwụ taa:

Onnoghen

Onye bụbu ọkaikpe ukwu Naijiria bụ Walter Onnoghen ga-amata ebe ọ kwụ taa dịka a ga-ekpebi ikpe gbasara akụnaụba ya a sị na ọ depụtachaghị ka ọ ha taa bụ Tọzde.

______________________________________________________________________________________________________________________________________

Malabu: Ụlọikpe enyela iwu ka a nwuchie Adoke,Etete na ndị ọzọ

Skip X post, 2
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post, 2

Ụlọikpe ukwu nọ n'Abuja enyela EFCC ikike inwụchi onye bụbụ Mịnịsta na-ahụ maka ikpe bụ Mohammed Adoke, na onye bụbu mịnịsta na-ahụ maka mmanụ agbidi bụ Dan Etete maka aka n' ebubo gbasara ebubo nrụrụaka so nkwekọrịta orire mmanụ Malabu.

Ndị ọzọ o kwukwara ka a nwụchie gụnyere Raph Wetzels, Casula Roberto, Pujato Stefeno, nakwa Burrato Sebastiano.

Ndị a niile bụ ndị a na-ebo ebubo n'aka ha dị na okwu nruru aka ahụ kwesịị ịbịa ụlọikpe ụbọchị iri na asaa nke ọnwa Eprelụ mana ahụghị ụkwụ ha n'ụlọikpe.

______________________________________________________________________________________________________________________________________

Iwu asaa Buhari jụrụ ajụ mana Sineti binyere aka

Ụlọọrụ ndị Sineti Naịjiria

Ebe foto si, @NGRSenate

Ụlọoomeiwu ukwu ebinyela aka n'iwu ga-eme ka a tụọ onye nkịtị ọbụla yi uwe ndị uweojii were ga ntọ mkpọrọ afọ ise mana iwu ahụ ekwughị ihe a ga-eme onye uweojii ji ike ekwesịghị ekwesị merụọ onye nkịtị ahụ maọbụ bute ọnwụ ya.

Nke yiri ibe ya, ndị ụlọomeiwu ukwu binyere aka ma wepụta iwu asaa nke Ọnyeisiala Buhari jụburu ibinye aka na ya n'ihi ihe ọ kpọọ ikerịta ọrụ dị na ngalaba gọmentị dị iche iche.

I wu ndị agụ gụnyere Iwu gbasara nchekwa mmanụ dị n'ala(PIGB), Iwu ịhazigharị ụgwọ a na-akwụ maka stampụ.(stamp duties), Iwu hiwere agụmagụ banyere njem nleta(National Institute of Hospitalism and Tourism) nakwa nke Kaụncul ga-naahụ maka nchọpụta(National Research and Innovation Council).

Iwu ndị ọzọ gụnyere nke ime ka ụlọfrrụ Inec kwụrụ onwe ya( Independent National Electoral Commission (INEC) Act 2010 (Amendment),ngalaba maka nchekwa mkpụrụ a na-akọnye n'ala( National Agricultural Seeds Council Bill) nakwa ngalaba mgbazinnye ego maka ọrụugbo ( Agricultural Credit Guarantee Scheme Fund)

______________________________________________________________________________________________________________________________________

Facebook adajọọla ọzọ

Facebook na Cambridge Analytica

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Otụtụ mmadụ nọ n'elu facebook na mba uwa

Ụlọọrụ Facebook gbara ama na ha gbara akara igbe ozi ihe karịrị otu ndị̄ mmadụ n'ọ n'igwe okwu ha kemgbe afọ 2016 n'anwụ na amaghị ama.

Ha kwukwara na ha na-agba mbọ ịkagbu ozi ndị a ha gbara n'anwụ na anataghị ikike ndị nwe ya.

______________________________________________________________________________________________________________________________________

N'egwuregwu

U-17 World Cup qualifier:Niajiria kụgburu Angola

Nigeria players and team members carry head coach Emmanuel Amuneke after winning the U-17 World Cup

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Nigeria players and team members carry head coach Emmanuel Amuneke after winning the Under-17s World Cup

Otu Golden Eaglet abụrụla otu egwu bọọlụ mbu na Africa nwetara ọnọdụ na asompi mbaụwa nke ndị akarịbeghị afọ iri na asaa dịka ha ji otu ọkpụ asataghị ihe were merie ndị Angola na asompi ha gbara Dar es Salaam ụbọchị Wenezde.

Gee akụkọ ndị a n'otu nkeji:

Aha nkeananụānụ, Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile