Ụlọikpe dị na Rivas Steeti eyigharịala ikpe igbochi ụlọomeiwu ịchụpụ Gọvanọ Fubara na osote ya

Ebe foto si, Siminalayi Fubara/X
Ụlọikpe Ukwu dị na Oyigbo Rivas Steeti eyigharịala ikpe Gọvanọ Siminalayi Fubara na osote ya bụ Ngozi Odu gbara iji gbochie ụlọomeiwu steeti ahụ ịga n'ihu n'atụmatụ ha malitere iji chụpụ ha abụọ n'ọkwa ruo oge a na-amaghị.
Ọkaikpe Florence Fiberesima nke ụlọikpe ahụ, kpebiri nke a dịka o nwetara ozi na e nwere ikpe abụọ banyere okwu ahụ nọ n'ụlọikpe.
Ụlọikpe ahụ kwuru na nyigharị ahụ ga-enye ụlọikpe mkpegharị ohere iji kpebie n'akwụkwọ a gbara ha ji.
Ọkaikpe Fiberesima yigharịrị ikpe ahụ ruo oge ụlọikpe mkpegharị kpebiri n'ikpe ahụ.
Ọkaikpe Ukwu Rivas Steeti ajụla ihiwe kọmiiti ga-achụpụ Gọvanọ Fubara na osote ya n'ọkwa

Ebe foto si, Siminalayi Fubara/X
Ọkaikpe Ukwu Rivas steeti bụ Ọkaikpe Simeon Amadi agwala ụlọomeiwu steeti ahụ na ya agaghị ehiwe otu kọmiiti ga-enyocha Gọvanọ Siminalayi Fubara na osote ya bụ Ngozi Nma Odu.
Nke a na-abịa dịka ụlọomeiwu ahụ degaara ya akwụkwọ ka o hiwe kọmiiti ahụ ga-enyocha Gọvanọ Fubara na osote ya dịka ha na-achọ ịchụpụ ha n'ọkwa.
Akwụkwọozi Ọkaikpe Amadi degaara onyeisi ụlọomeiwu ahụ bụ Martin Amaewhule mere ka o doo anya na ya agaghị ehiwe otu kọmiiti mmadụ asaa ahụ n'ihi na ụlọikpe enyela iwu ka ha kwụsị atụmatụ ịchụpụ Gọvano Fubara na osote ya.
Ọkaikpe Amadi kwuru na mkpebi ụlọikpe ahụ bụ ihe na-egbochi ya ihiwe otu kọmiiti ahụ ụlọomiweu ahụ chọrọ ka o hiwe.
Ọ gwara ụlọomeiwu ahụ na Gọvanọ Fubara wegara okwu ahụ n'ụlọikpe ma nweta mkpebi ụlọikpe ahụ kemgbe 16 Jenụwarị, 2026 nke gwara ya ka ọ ghara ịnabata maọbụ lebanye anya n'akwụkwọ mkpesa ọbụla banyere atụmatụ ịchụpụ Gọvanọ Fubara na osote n'ọkwa.
Ọkaikpe Amadị kwuru na "dịka onyeisi n'ihe gbasara ikpe na Rivas steeti, agaghị m enupuisi nye mkpebi ụlọikpe banyere okwu a'.
Ụlọomeiwu Rivas Steeti agwala Ọkaikpe Ukwu steeti ahụ ka o tinye ọnụ n'atụmatụ ịchụpụ Gọvanọ Fubara n'ọkwa

Ebe foto si, SimFubaraKSC/X
Ụlọomeiwu Rivas Steeti ekwuola na ha ga-aganihu n'atụmatụ ha ịchọpụ Gọvanọ Siminalayi Fubara na osote ya bụ Ngozi Odu n'ọkwa ma kpọkuo Ọkaikpe Ukwu steeti ahụ Ọkaikpe Simeon Chibuzor Amadi ka o hiwe otu kọmiiti ga-enyocha ebubo ndị ahụ ha boro Gọvanọ Fubara na osote.
Ụlọomeiwu ahụ mere ka a mata nke a n'ụbọchị Fraịde 16 Jenụwarị, 2026 n'ọgbakọ ha nwere, kwuru na Gọvanọ Fubara azaghachibeghị akwụkwọ ozi banyere atụmatụ iwepụ ya n'ọkwa ha zigaara ya kemgbe.
N'aka nke ọzọ, ndị omeiwu anọ ahụ kwuru na ha aka ha adịghịzi n'atụmatụ ịchụpụ Gọvanọ Fubara, ekwuola ugbua na ha ga-aganihu sonye n'atụmatụ ahụ ọzọ.
Ụlọomeiwu ahụ kwuru na iwu kwadoro atụmatụ ịchụpụ Gọvanọ Fubara na osote ya ma kwuo na ha na-eme nke a maka ọdịmma ndị Rivas steeti.
Ndị omeiwu nwaanyị abụọ akpọọla oku ka a kwụsị atụmatụ ịchụpụ Fubara

Ebe foto si, Siminalayi Fubara
Ndị omeiwu nwaanyị abụọ n'Ụlọomeiwu Riva Steeti esorola kpọọ oku ka a kwụsị usoro iwezuga Siminalayi Fubara na Ngozi Odu dịka gọvanọ na osote gọvanọ steeti ahụ.
Ndị omeiwu ahụ bụ Barile Nwakoh na-anọchite anya mpaghara Khana I na Emilia Amadi na-anọchite anya mpaghara Obio/Akpor II.
Ha kpọrọ oku arịrịọ a oge ha na-anabata ucheobi onye ndu ndị omeiwu ọnụọgụ ha na-ebuchaghị ibu n'Ụlọomeiwu ahụ bụ Sylvanus Enyinna Nwankwo.
Ọnọdụ a bịara n'ime ihe na-erughị ụbọchị abụọ ndị omeiwu abụọ gụnyere Sylvanus Enyinna Nwankwo na Peter Abbey na-anọchite anya mpaghara Degema kpọrọ oku n'ihu ọha ka ndị omeiwu kwụsị usoro iwezuga Fubara dịka gọvanọ.
Cheta na ọ bụ n'ụbọchị Tọzde 8 Jenụwarị, 2026 ka Ụlọomeiwu Riva Steeti malitere usoro ịchụpụ Gọvanọ Siminalayi Fubara n'ọkwa, dịka ha bochara ya ebubo dị iche iche, nke gụnyere na o gosibeghị ha atụmatụ mkpata na mmefu ego nke afọ 2026.
Siminalayi Fubara: APC ajụla ịnabata atụmatụ ịchụtu Gọvanọ Rivas steeti n'ọkwa

Ebe foto si, Siminalayi Fubara/Facebook
Otu APC na Rivas Steeti ekwuola na ha agaghi anabata ka Ụlọomeiwu steeti ahụ chụtuo aka na-achị steeti ahụ bụ Simi Fubara n'ọkwa Gọvanọ.
Ụlọomeiwu Riva Steeti malitere usoro ịchụtu gọvanọ steeti ahụ bụ Siminalayi Fubara na Osote ya bụ Ngozi Odu n'ọkwa n'ihi ebubo na ha wepụtara Bọjet afọ 2025 na anataghị nkwado nke ụlọomeiwu ahụ.
N' akwụkwọ mgbasaozi nke ọnụ na-ekwuru APC na Rivas Steeti bụ Darlington Nwauju binyere aka ma wepụta, otu ahụ kwuru na ha agaghị enye okere ka eburu katata si PDP bata na otu ha.
Ozi ahụ sịrị, "Anyị na-ajụ kpamkpam usoro nchutu megide Gọvanọ anyị na-osote ya ."
"Pati anyị agaghị agba nkịtị ka esemokwu mere n'ime otu PDP selitekwa isi ya ọzọ na pati anyị."
Cheta na nke a bụ nke atọ ugboro atọ Ụlọọmeiwu Steeti na-agbali ịchụtu Fubara n'ọkwa gọvanọ.
Abụọ mere oge ọ nọ n'otu PDP bụ ebe o siri wụbaa otu APC na nsonso a.
Simi Fubara: APC ajụla ịnabata atụmatụ ịchụtu Gọvanọ Rivas steeti n'ọkwa
Ụlọomeiwu Riva Steeti amalitela usoro ịchụpụ Fubara dịka gọvanọ

Ebe foto si, Siminalayi Fubara/X
Ugbua, i nwereike inweta akụkọ BBC Igbo niile n'ekwenti gị.
Pịa aka ebe a ka i soro anyị
Ebe Ọkwa azụmahịa WhatsApp kwụsịrị
Ụlọomeiwu Riva Steeti amalitela usoro ịchụpụ gọvanọ steeti ahụ bụ Siminalayi Fubara n'ọkwa.
Nke a kpọtụrụ oge ndị omeiwu nke ụlọomeiwu ahụ nwere nnọkọ ha n'ụtutu Tọzde 8 Jenụwarị, 2026.
Ndị omeiwu boro Fubara ebubo dị iche iche, nke gụnyere na o gosibeghị ha atụmatụ mkpata na mmefu ego nke afọ 2026.
Oge ha nwechara nrụrịtaụka, Onyeisi ụlọomeiwu ahụ bụ Rt. Hon. Martin Chike Amaewhule tinyere ya na vootu iji mara ndị chọrọ ka usoro mwezuga Fubara malite, mana ndị omeiwu niile bịara nzukọ jiri otu obi nabata ya.
Cheta na ọ bụ n'ụbọchị 18 Maachị, 2025 ka Onyeisiala Bola Tinubu kwupụtara ọnọdụ gbatagbata na Riva Steeti ma wepụtụ Siminalayi Fubara na Ngozi Odu dịka gọvanọ na osote gọvanọ ruo ọnwa isii maka nsogbu dị n'etiti ya na ndị ụlọomeiwu na steeti ahụ.
N'aka nke ọzọ, Tinubu kwusịtụrụ ndị omeiwu steeti ahụ ọrụ ruo ọnwa isii maka nsogbu ahụ.
Dịka ọnwa isii gachara, Onyeisiala Tinubu wepụkwara ọchịchị gbatagbata ahụ ma kpọghachita Gọvanọ Siminalayi Fubara dịka Gọvanọ steeti n'ụbọchị Wednezde 17 Septemba 2025.
Nkpọghachi n'ọrụ ahụ gụnyekwara osote aka na-achị steeti ahụ ya na ndị omeiwu steeti ahụ.





























