Sim Fubara: APC ajụla ịnabata atụmatụ ịchụtu Gọvanọ Rivas steeti n'ọkwa

Ebe foto si, Siminalayi Fubara/Facebook
Otu APC na Rivas Steeti ekwuola na ha agaghi anabata ka Ụlọomeiwu steeti ahụ chụtuo aka na-achị steeti ahụ bụ Simi Fubara n'ọkwa Gọvanọ.
Ụlọomeiwu Riva Steeti malitere usoro ịchụtu gọvanọ steeti ahụ bụ Siminalayi Fubara na Osote ya bụ Ngozi Odu n'ọkwa n'ihi ebubo na ha wepụtara Bọjet afọ 2025 na anataghị nkwado nke ụlọomeiwu ahụ.
N' akwụkwọ mgbasaozi nke ọnụ na-ekwuru APC na Rivas Steeti bụ Darlington Nwauju binyere aka ma wepụta, otu ahụ kwuru na ha agaghị enye okere ka eburu katata si PDP bata na otu ha.
Ozi ahụ sịrị, "Anyị na-ajụ kpamkpam usoro nchutu megide Gọvanọ anyị na-osote ya ."
"Pati anyị agaghị agba nkịtị ka esemokwu mere n'ime otu PDP selitekwa isi ya ọzọ na pati anyị."
Cheta na nke a bụ nke atọ ugboro atọ Ụlọọmeiwu Steeti na-agbali ịchụtu Fubara n'ọkwa gọvanọ.
Abụọ mere oge ọ nọ n'otu PDP bụ ebe o siri wụbaa otu APC na nsonso a.
Simi Fubara: APC ajụla ịnabata atụmatụ ịchụtu Gọvanọ Rivas steeti n'ọkwa
Ụlọomeiwu Riva Steeti amalitela usoro ịchụpụ Fubara dịka gọvanọ

Ebe foto si, Siminalayi Fubara/X
Ugbua, i nwereike inweta akụkọ BBC Igbo niile n'ekwenti gị.
Pịa aka ebe a ka i soro anyị
Ebe Ọkwa azụmahịa WhatsApp kwụsịrị
Ụlọomeiwu Riva Steeti amalitela usoro ịchụpụ gọvanọ steeti ahụ bụ Siminalayi Fubara n'ọkwa.
Nke a kpọtụrụ oge ndị omeiwu nke ụlọomeiwu ahụ nwere nnọkọ ha n'ụtutu Tọzde 8 Jenụwarị, 2026.
Ndị omeiwu boro Fubara ebubo dị iche iche, nke gụnyere na o gosibeghị ha atụmatụ mkpata na mmefu ego nke afọ 2026.
Oge ha nwechara nrụrịtaụka, Onyeisi ụlọomeiwu ahụ bụ Rt. Hon. Martin Chike Amaewhule tinyere ya na vootu iji mara ndị chọrọ ka usoro mwezuga Fubara malite, mana ndị omeiwu niile bịara nzukọ jiri otu obi nabata ya.
Cheta na ọ bụ n'ụbọchị 18 Maachị, 2025 ka Onyeisiala Bola Tinubu kwupụtara ọnọdụ gbatagbata na Riva Steeti ma wepụtụ Siminalayi Fubara na Ngozi Odu dịka gọvanọ na osote gọvanọ ruo ọnwa isii maka nsogbu dị n'etiti ya na ndị ụlọomeiwu na steeti ahụ.
N'aka nke ọzọ, Tinubu kwusịtụrụ ndị omeiwu steeti ahụ ọrụ ruo ọnwa isii maka nsogbu ahụ.
Dịka ọnwa isii gachara, Onyeisiala Tinubu wepụkwara ọchịchị gbatagbata ahụ ma kpọghachita Gọvanọ Siminalayi Fubara dịka Gọvanọ steeti n'ụbọchị Wednezde 17 Septemba 2025.
Nkpọghachi n'ọrụ ahụ gụnyekwara osote aka na-achị steeti ahụ ya na ndị omeiwu steeti ahụ.








