Ọnọdụ Fubara dịka nke onye a na-akpagbu mechara hụụ onye na-akpagbu ya n'anya - PDP

Ebe foto si, PDP/Facebook/Fubara/X
Peoples Demcoratic Party (PDP) agbarụọla ihu n'ọpụpụ Gọvanọ Rivas Steeti bụ Siminalayi Fubara si na pati ha pụọ ma banye na All Progressive Congress (APC) ma kwuo na ọ bụ ihe "ọmịiko."
Fubara bụ onye sin a pati ahụ pụọ n'ụbọchị Tuzde 9 Disemba, 2025 kwuru na ọ bụ maka na pati PDP enyeghi nchekwa ka o jiri pụọ banye APC nọ n'ọchịchị.
Odeakwụkwọ mgbasaozi pati ahụ nke alaka Kabiru Turaki nọ n'isi ya bụ Ini Ememobong kwuru na gọvanọ "ji obi ọcha ya soro n'ụzọ dugara ọnọdụ ọ nọ ugbua."
Ha kwuru na Fubara agaghị agbagharị azụ ugbua ma sị na pati ha gbahapụrụ ya maọbụ echekwaghị ya.
Ha kwuru na onye ọbụla na-eso etu ije Fubara si gaa ga-echeta na ọ bụ ya ji aka ya gaa njem ebe ọ nọ ugbua. Ha kwuru na Gọvanọ Fubara kwesịrị ekele ụmụafọ Naịjirịa n'etu ha si kwụdo ya n'azụ kamgbe o nwere nsogbu.
Ha gara n'ihu kpee ekpere ka ọnọdụ Fubara ghara ịbụ nke onye a na-akpagbu mechara hụụ onye na-akpagbu ya n'anya.
N'otu aka ahụ, katọọ pati APC ma kwuo na agwa ha na-akpa bụ ime ka e nwee naanị otu pati na Naịjirịa nke megidere iwu ọchịchị onye kwuo uche ya.
Ha rịọrọ ụmụafọ Naịjirịa ka ha gbakọta aka ọnụ ka kwụsị ụdịrị agwa a pati APC chọrọ ịkpa.
Ihe mere Fubara jiri hapụ PDP banye APC

Ebe foto si, Sim Fubara/X
Aka na-achị Riva Steeti bụ Siminalayi Fubara abanyela n'otu ndọrọndọrọ ọchịchị All Progressives Congress (APC).
Fubara, onye bụbu otu n'ime ndị gọvanọ ole na ole fọdụrụ n'otu Peoples Democratic Party (PDP) kwuru na ya natara nkwado ịhapụ pati ahụ.
N'ọgbakọ ọ nọrọ kwupụta ọpụpụ ya na PDP, Fubara sịrị na ya gara hụ Onyeisiala Tinubu n'ụbọchị Mọnde 8 Disemba, 2025 iji kpaa maka ọdịmma Riva Steeti.
"Achọghị m ịzọhie ụkwụ n'oge ugbua, maọbụ danye n'olulu ọbụla nke mmadụ ọbụla gwuuru anyị," ka Fubara kwuru.
O kwuru na ya kpebiri ịpụ na pati PDP maka na ha enweghị mkpuchi ọbụla.
"Ihe kachasị ụtọ na nzukọ a bụ ihe ahụ ụnụ na-eche kemgbe. Anyị enweela mkpebi ahụ taa, anyị na-agafe na pati APC."
Ugbua, i nwereike inweta akụkọ BBC Igbo niile n'ekwenti gị.
Pịa aka ebe a ka i soro anyị
Ebe Ọkwa azụmahịa WhatsApp kwụsịrị
Fubara kwuru na ya kpebiri ịhapụ PDP iji kwado Onyeisiala Bola Tinubu nke APC, ma kwuo na ya gaara abụ "aka chịburu" Riva steeti ugbua ma e wezuga nkwado Tinubu.
"Ihe mere anyị ka ji kwụrụ n'ụkwụ anyị bụ n'ihi ebe ahụ, ma nke bụ eziokwu bụ na e wezuga Onyeisiala, agaghị enwe onye dịka Gọvanọ Siminalayi Fubara; ọ gaara abụ "onye bụbu gọvanọ".
"Ya mere, anyị nwere ikike niile maka na nke bụ eziokwu, ka a ghara ịghọrị onye ọbụla na steeti a, anyị nwere mmadụ, anyị nwere ndị nkwado. Naani etu anyị pụrụ isi kelee Onyeisiala bụ inye ya nkwado".
"Anyị agaghị akwado Onyeisiala ma ọ bụrụ na anyị anabataghị ya, ọ bụghị nkwado egbugbereọnụ. Ya mere, anyị enweela mkpebi ahụ taa, n'ihi na e nyela anyị ikike," ka Fubara gbakwunyere.
Gọvanọ Siminalayi Fubara banyere APC ka ọ gachara ụbọchị anọ Onyeisi Ụlọomeiwu Riva Steeti bụ Martin Amaewhule na ndị omeiwu iri na asaa gbahapụrụ PDP ma banye APC n'ụbọchị 5 Disemba, 2025.
Ka ọ dị ugbua, Gọvanọ Fubara esonyela n'ọnụọgụ ndị gọvanọ PDP gafere n'otu ndọrọndọrọ ọchịchị APC.








