Wike na Fubara: Enyi abụọ na-alụ ọgụ mana lee ndị na-ata ahụhụ ya na Rịvas Steeti

Aha onyonyo, Wike na Fubara: Enyi abụọ na-alụ ọgụ mana lee ndị na-ata ahụhụ ya na Rịvas Steeti
Wike na Fubara: Enyi abụọ na-alụ ọgụ mana lee ndị na-ata ahụhụ ya na Rịvas Steeti

E nwere okwu amamihe sịrị na 'mgbe enyi abụọ na-alụ ọgụ, ọ bụ ahịhịa na-ata afụfụ ya karịa'.

Kemgbe esemokwu nọ n'etiti Gọvanọ Sim Fubara na Nyesom Wike bidoro, ndị Rivas steeti na-achọ ụzọ ha si apụta n'ime osimiri nsogbu ndị ọchịọchị abụọ ahụ tinyere ha n'isi.

Mkpebi nke otu jikọrọ ndị ọkaiwu bụ Nigeria Bar Association (NBA) ịwega ọgbakọ ha na-enwe kwa afọ nke ha hibere na Pọtakọt gaa Enugwu Steeti ma na-akatọ omume onye ọchịchị gbatagbata na-achị Rivas steeti bụ Ibok-Ete Ibas na-egosi etu ihe si efunarị Rịvas steeti ugbua.

Ọgbakọ NBA ahụ bụ nke nwereike ime ka ọtụtụ ndị ahịa rita uru na ya ma ọ bụrụ na e mere ya na Pọtakọt.

Kedụ ndị ọgụ a kacha emetụta ugbua?

Gọvanọ Sim Fubara na Nyesom Wike

Ebe foto si, Nyesom Wike / X

Nkọwa foto, Gọvanọ Sim Fubara na Nyesom Wike

Ọchịchị Fubara bụ nke ikpeazụ ndị si na mpaghara akụkụ mmiri (Riverine) na-enweta ohere ịbụ Gọvanọ na Rivas steeti kemgbe afọ iri abụọ na ise.

Na mmalite esemokwu a dị n'etiti Fubara na Mịnịsta na-ahụ maka FCT bụ Nyesom Wike, bụ nke metụtara ndị otu ụlọomeiwu steeti ahụ..

Ọnọdụ Rivas steeti ugbua dịka ilu okwu Igbo sị na 'onye ji mmadụ na-ala, ji onwe ya' maka na ihe niile na-eme ugbua metụtara onye ọbụla n'agbanyeghị ọrụ onye na-arụ.

Ụfọdụ ndị BBC gbara ajụjụ ọnụ kwuru na "Etu ha si ebi ndụ tupu Onyeisiala Bola Tinubu ewepụ Gọvanọ Fubara n'oche agbanwela"

Ihe ụmụ amaala Rivas steeti na-ekwu ugbua

Ndị na-azụ ahịa na Rivas Steeti
Nkọwa foto, Ndị na-azụ ahịa na Rivas Steeti

Ụfọdụ ndị BBC Igbo gbara ajụjụ ọnụ kwuru na Riva steeti agaghị enweta onwe ya ọzọ maka na "ihe na-eme ugbu a jọrọ oké njo".

"Ọtụtụ ndị mmadụ enwekwaghị olile anya na ntụkwasị obi n'ọchịchị onye kwuo uche ya ga-ewe isi n'obodo anyị, karịsịa n'oge ntuliaka"

"Tinubu na ndị otu ya ewepula ndị anyị tinyere na-oche, ihe agaghị adịkwa mma ọzọ".

Ndị ọzọ tinyere ọnụ maka agwa ndị nnọchiteanya na akpa kamgbe Onyeisiala Bola Tinuhu zitere ọnye ọchịchị gbatagbata na Riva steeti.

"ihe na-afụ m ụfụ n'obi bụ na kamgbe e wepụrụ ndị nnọchiteanya n'oche, ha agbaala ọsọ ga n'obodo oyibo na-eri ụwa ma hapụ ndị ha kwesịrị inochite anya"

Tupu ndọrọndọrọ ọchịchị 2023 erute, ụfọdụ ndị nọ n'ụlọomeiwu gwara anyị na ha ga ejere anyị ozi ma weta ọganiru na mpaghara dị icheiche na Riva steeti mana akparamagwa nke ha na-egosi ugbua nsogbu malitere na-egosi na ha gara ụlọ omeiwu na mmasị onwe ha nakwa naanị ezinụlọ ha.

Nsogbu dị n'ime Rivers State malitere na Ọktoba 2023, na-esochi esemokwu ndọrọ ndọrọ ọchịchị dị n'etiti Gọvanọ Fubara na onye bubu govano nke bu Minista of FCT ugbu a Nyesom Wike. Ogbunigwe nke aturu na-akụkụ nke ulo ndi nnochiteanya Rivas steeti na 29 Ọktoba 2023 mere ka esemokwu dịkwuo elu.

Na onwa Disemba 2023, ndị omeiwu 27 hapụrụ PDP ma banye APC. Nke a butere ajụjụ banyere ihe iwu kwuru banyere ụdịrị omume a. Otutu ndi ụlọomeiwu na-erubere Nyesom Wike isi, malitere okwu iwepu Govano Fubara n'ọkwa nke a mere ka Rivas steeti ma jijiji.

Cheta na Onyeisiala Tinubu akpọọla Fubara na Wike oku ka ha kwusi esemokwu a mana ọ dị ka mmiri a nwụrụ n'okwute.

Ka ọtụtụ ọgbaaghara a gasịrị, Onyeisiala Tinubu mara ọkwa na ọ kwụsịla Gọvanọ Fubara, osote ya na ndị omeiwu Rivas Steeti ọrụ ma nye iwu ka Ibokette Ibas bụrụ onye nchịkwa ga na-elokọta Rivas steeti ruo onwa isii.