Gịnị mere FBI na DEA ji chọọ ịwepụta akwụkwọ nnyocha ha mere banyere Onyeisiala Tinubu?

Onyeisiala Naịjirịa bụ Bola Ahmed Tinubu

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Onyeisiala Naịjirịa bụ Bola Ahmed Tinubu
Oge e ji agụ akụkọ nkeji 3

Kemgbe abalị garaaga ka ihe gbasara nnyocha ndị ụlọọrụ Federal Bureau of Investigation (FBI) na Drug Enforcement Administration (DEA) nke mba Amerịka mere n'isi Onyeisiala Naịjirịa bụ Bola Ahmed Tinubu na-akpọtụ akpọtụ.

Ihe gbasara okwu a na-ada ụda n'ebe niile na Naịjirịa ọkachasị na soshal mịdịa nakwa n'etiti ndị ndọrọndọrọ ọchịchị ma ndị nkwado ha.

Nnyọcha ahụ FBI na DEA mere bụ maka ebubo a na-ebo Onyeisiala Bola Ahmed Tinubu banyere ịre ọgwụike na ị so n'otu na-ere ya bụ nke e boro ya na mba Amerịka.

Ebubo ahụ so n'okwu a kpụ n'ọnụ kemgbe afọ iri na atọ garaaga ọkachasị n'afọ 2023 mgbe Naịjirịa mere ntuliaka Onyeisiala.

Mana ugbua, a na-atụ anya na FBI na DEA ga-ewepụta ihe niile ha hụru n'oge ha mere nnyocha n'isi Onyeisiala Tinubu dịka mkpebị ụlọikpe si gwa ha.

Etu ihe niile siri bido

FBI

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, FBI

N'etiti afọ 2022 na 2023 ka nwoke Amerịka bụ onye nwe ụlọọrụ PlainSite aha ya bụ Aaron Greenspan gara ka FBI na DEA nye ya ndekọ nnyocha ha mere n'isi Bola Ahmed Tinubu, na Lee Andrew Edwards, Mueez Abegboyega Akande, na Abiodun Agbele maka ebubo gbasara ire ọgwụike.

Mana n'oge ahụ, FBI na DEA nyere nwoke ahụ ọsịsa gbagwojuru mmadụ anya. Ọsịsa ha nyere bụ nke ha na-akpọ "Glomar responses".

Ihe "Glomar responses" pụtara bụ na FBI agaghị ekwu maọbụ eziokwu maọbụ okwu asị na ha mere Tinubu nnyocha banyere ire ọgwụike.

Ọ bụ otu ọsịsa ahụ ka ụlọọrụ DEA nakwa ndị ọzọ nyere nke gbochiri ndị mmdụ ịmara nke bụ eziokwu ma mee ka e buga okwu ahụ n'ụlọikpe.

Mkpebi ụlọikpe nyere

Onyeisiala Naịjirịa bụ Bola Ahmed Tinubu

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Onyeisiala Naịjirịa bụ Bola Ahmed Tinubu

N'abalị asatọ nke ọnwa Eprel 2025 ka Ọkaikpe bụ Beryl Howell nyere iwu ka FBI na DEA "chọta ndekọ banyere nnyocha ha mere n'isi Tinubu na ndị ọzọ ma wepụta ya".

Ụlọikpe ahụ wezugara ọsịsa "Glomar responses" ahụ FBI na DEA nyere n'oge e degara ha akwụkwọ ka ha nye ọsịsa banyere nnyocha ha mere Tinubu.

Cheta na "Glomar responses" bụ ikike ụlọọrụ gọọmenti Amerika were nke ga-eme ka ha hara ịsa ajuju ọbụla a juru ha gbasara ndekọ maọbụ nnyocha ọbụla ha mere.

Mana ụlọikpe kwuru na FBI na DEA enweteghị ihe kwadoro ha ịnye udiri ọsịsa 'Glomar" ahụ ha nyere mgbe a juru ha banyere Tinubu.

Ụlọikpe nyere mkpebi ka FBI na DEA gaa chọpụta ndekọ niile na nnyocha ha mere gbasara Tinubu ma wepụta ya.

Ihe gọọmentị Onyeisiala Tinubu kwuru maka ndekọ FBI na DEA ga-ewepụta

Bayo Onanuga bụ ọnụ na-ekwuru gọọmenti etiti Naịjirịa ma bụrụ onye ozi pụrụiche nke Onyeisiala Bola Tinubu nyere ọsịsa banyere mkpebi ụlọikpe nyere maka nnyocha FBI mere n'isi Tinubu.

Onanuga n'akara X soshal mịdịa kwuru na "ọtụtụ ndị ntaakụkọ akpọọla m banyere mkpebi ụlọikpe dị na Washington DC bụ nke nyere iwu ka ụlọọrụ FBI na DEA wepụta akwụkwọ na ndekọ nnyocha ha mere n'isi Onyeisiala Bola Ahmed Tinubu".

"Ọsịsa anyị bụ na enweghị ihe ọhụrụ dị na ya. Akụkọ na ndekọ onye ọrụ FBI bụ Moses nakwa ndekọ ndị DEA nwere n'isi Tunubu bụ ihe mmadụ niile maara maka ya kemgbe afọ iri atọ garaaga. Ndekọ ahụ niile enweghị nke mara Tinubu ikpe".

"Ndị ọkaiwu anyị na-atule mkpebi ụlọikpe Washington DC nyere".