Ụfọdụ ihe i kwesịrị ịma gbasara 'Chairman' Christian Chukwu

Ebe foto si, Getty Images
Oge e ji agụ akụkọ nkeji 3
- A mụrụ ya n'ụbọchị 4 Jenụwarị 1951 n'Uwani dị n'okpuru ọchịchị Enugu South n'Enugwu steeti.
- Ọ gụrụ akwụkwọ praịmarị n'ụlọakwụkwọ Christ Church Primary School, Uwani ma gụọ nke sekọndịrị na National Secondary School Nike, Enugwu.
- Ọ gbara bọọlụ n'otu egwu bọọlụ Rangers nke Enugwu n'afọ 1972 ma mechaa soro na ndị nlekọta otu egwu bọọlụ ahụ n'afọ 1982.
- N'afọ 1977, o duuru otu egwu bọọlụ Flying Antelopes gaa mabute iko mba Afrịka n'asọmpi African Cup Winners Cup anaghị agbazi ugbua.
- Christian Chukwu bụ kaptịn Naịjirịa mbụ mabutere iko n'asọmpi African Nations Cup oge ha jichara ọkpụ goolu atọ asataghị otu merie otu egwu bọọlụ mba Ọljirịa n'afọ 1980.
- N'afọ 1985, ọ rụrụ ọrụ dịka osote onye nchịkọta otu egwu bọọlụ Naịjirịa ndị akarịbeghị afọ iri na isii (U-16) dịka Naịjirịa mabutere iko asọmpi ahụ a haziri na mba Chaịna.
- O nyeere onye nchịkọta si mba Netherlands bụ Clemens Westerhof aka oge Naịjirịa mabutere iko African Cup of Nations (AFCON) nke abụọ ha n'afọ 1994.
- Christian Chukwu bụụrụ onye nchịkọta otu egwu bọọlụ Super Eagles site n'afọ 2002 ruo 2005.
- Nwaamadị a duuru otu egwu bọọlụ Super Eagles gaa Tunishịa n'afọ 2004 maka asọmpi Africa Cup of Nations (AFCON) bụ ebe ha gbara ndị nke atọ.
- E mechara chụọ ya dịka onye nchịkọta Super Eagles n'afọ 2005 n'oge ịmaaka ntozuoke maka Iko Mbaụwa a gbara na mba Germany n'afọ 2006.
- A na-etu ya 'Chairman' maka ike dị egwu ọ kpara oge ọ na-agbara otu egwu bọọlụ Rangers nke Enugwu nakwa otu egwu bọọlụ ndị nke Naịjirịa.
- N'afọ 2019, ọ dara ọrịa, bụ nke mere e ji bugaa ya Lọndọn oge ahụ maka ọgwụgwọ ebe ndị mmadụ fesara akụkọ ụgha n'afọ 2021 na ọ nwụọla.
- Christian Chukwu nwụrụ n'ụbọchị Satọde 12 Eprel 2024 dịka ọ gasịrị mkpụrụ ụbọchị iri abụọ e chetara afọ iri anọ na ise ndị Super Eagles mabutere iko AFCON nke afọ 1980.
- Ọ gbara afọ iri asaa na anọ (74) tupu ọ nwụọ.
- Ọ lụrụ nwunye ma mụta ụmụ anọ; ndị nwoke abụọ na ndị nwaanyị abụọ.
Christian Chukwu na-agbaburu Super Eagles alaala mmụọ

Ebe foto si, Getty Images
Maazị Christian Chukwu na-agbaburu otu egwu bọọlụ Super Eagles nke Naịjirịa anwụọla ka ọ gbachara afọ iri asaa na anọ (74).
Nwaamadị ahụ bụ ọkaibe n'egwuruegwu bọọlụ lara mmụọ n'ụzọ ụtụtụ ụbọchị Satọde 12 Eprel 2025.
Ọnọdụ butere ọnwụ ya bụ nke edochaghị anya.
Onye otu ya ma bụrụkwa ezigbo enyi ya bụ Olusegun Odegbami mere ka a mata nke a.
Odegbami kwuru na ya nwetara ozi mgbe ọ kụrụ ihe dịka elekere iri nke ụtụtụ na ezigbo enyi ya bụ 'Chairman' Christian Chukwu MFR anwụọla.
Ọ sị na ọ bụ Babuje, Emmanuel Okala mere ka ọ mata banyere ọnwụ Chukwu dịka ọ gọrọ ọfọ ka mkpụrụobi ezigbo "ọyị ya" zuru ike na ndokwa.

Ebe foto si, Getty Images




