Etu ụmụafọ Enugwu si eru uju n'olili ozu Igbo-Jah, onye a gbagburu n'ụlọ ndị uweojii

Ọtụtụ ndị enyi, ikwu na ibe, ezinaụlọ nakwa ndị ọzọ agbakọọla n'ahịa dị n'Ogui Nike n'okpuruọchịchị Enugwu North nke Enugwu steeti n'ụbọchị Fraịde 11 Eprel, 2025 maka olili ozu otiegwu Okezie Chikezie Mba a ma ama dịka Igbo-Jah.
E butere ozu Igbo-Jah n'ogige a kpọrọ 'ahịa 9' dị n'Obiagu, Enugwu steeti ebe a ga-anọ kaara ya ụka ikpeazụ tupu a ga-lie ya n'ụlọ ya dị na Goshen Estate, Enugwu.
Igbo-Jah nwụrụ n'ụbọchị Fraịde 25 Ọktoba, 2024 dịka ọ gara n'ụlọọrụ itiri ha egwu.
Dịka Igbo-Jah na ndị otu ya tichara egwu na-achọ ịla, a nụrụ ụda egbe, nke e mechara chọpụta na mgbọ ya tụrụ Igbo-Jah ma gbuo ya.
Oge nke a mere, ọtụtụ ndị ntoroọbịa ndị obodo Obiagu malitere ime ngagharịiwe.

Kedụ ebe onye uweojii ahụ a sị gbagburu Igbo-Jah nọ ugbua?

Ebe foto si, Enugu State Police
Dịka e mere olili ozu Igbo-Jah n'Enugwu ụbọchị Fraịde 11 Eprel, 2025, ọtụtụ mmadụ na-ajụ ajụ banyere ebe onye uweojii ahụ a sị gbagburu Igbo-Jah nọ.
Nke mere ka BBC Igbo kpọtụrụ ọnụ na-ekwuru ndị uweojii Enugwu Steeti bụ Daniel Ndukwe onye gwara anyị na ụlọọrụ ndị uweojii achụọla nwaamadị ahụ aha ya bụ Ozonwanji Joseph e kwuru na ọ bụ ya gbapụrụ mgbọ egbe ahụ gburu Igbo-Jah n'ọrụ dịka onye uweojii.
Ọ gara n'ihu kwuo na ngwa ngwa e mechara nnyocha banyere ọnwụ Igbo-Jah, a kpụpụrụ Ozonwanji Joseph ụlọikpe.
Ndukwe kọwara nwaamadị nọ n'ụlọ mkpọrọ ma kwuo na ọ bụ ụlọikpe ka ọ dị n'aka inye nwaamadị ahụ ntaramahụhụ ma ha kpesie ya ikpe.
Ihe ị kwesịrị ịma maka Igbo-Jah

- Igbo-Jah, onye ezigbo aha ya bụ Okezie Chikezie Mba bụ otiegwu a ma ama n'Enugwu steeti.
- Ọ bụ onye Ogui Nike dị n'Enugwu steeti.
- Igbo-Jah lụrụ nwaanyị ma mụta ụmụ atọ tupu ọnwụ ya.
- Ọ bụ onye a maara nke ọma maka egwu Ogene ọ na-eti.
- O tiela ọtụtụ egwu gụnyere; Igbo Nwa Mba Isozikwa na Mmanwụ, Jee Gwa Nwa Enwe na Adaka na-abịa, Ogene Ụmụ Jesus, Ogene Igbo na Ogene Ụmụ Nkanu.
- A na-ahụkarị ya n'ọgbakọ mmemme dị iche iche ebe o ji egwu ogene emeta ndị mmadụ obiụtọ.
- Akụkọ kwuru na ndị uweojii kpọrọ ya ka ọ bịa tie egwu na ngalaba ụlọorụ ha na-ebu agha megide otu nzuzo n'ụbọchị Fraịde 25 Ọktoba 2024.
- Ka o tichara egwu na-ala, otu onye uweojii agbagbuo ya.
Ndị uweojii gburu Igbo-Jah ka ọkụkọ - Ikwu na ibe
Ndị ikwu na ibe Igbo-Jah eruola uju gbasara nwanne ha nwoke ndị uweojii gbagburu n'ụbọchị Fraịde 25 Ọktoba 2024 oge ọ gara i tiri ha egwu.
Ụfọdụ n'ime ha gwara BBC Igbo okwu sịrị na ndị uweojii gburu nwanne ha nwoke dịka ọkụkọ.
Ihe onyonyoo a na-egosi ka ụfọdụ n'ime ha siri gosipụta iwe ha oge a gbara ha ajụjụ.
Gọọmenti Enugwu enyela ụmụ Igbo-Jah agụmaakwụkwọ n'efu

Ebe foto si, Enugu State Government
Aka na-achị Enugwu steeti bụ Peter Mbah enyela nkwado ka e nye ụmụ Igbo-Jah atọ agụmaakwụkwọ n’efu.
O kwekwara nkwa na Gọọmenti Enugwu steeti ga-ahụ maka ọdịmma nwunye ya.
Ọ bụ kọmịsha na-ahụ maka ụmụaka na mmepe obodo tinyere onye nke na-ahụ maka omenala na nje m nlereanya kwupụtara nke a oge ha gara mgbaru n’ụlọ ya.
Ndị uweojii achụọla onye otu ha gbagburu Igbo-Jah ma kpụpụ ya ụlọikpe

Ebe foto si, Enugu Police Command
Ndị uweojii Enugwu steeti ekwuola na ha emechala ikpe ime ụlọ ma chụọ onye otu ha bụ Ozonwanji Joseph gbagburu otiegwu Chikezie Okezie Nwamba a ma dịka Igbo-jah.
Nwepụta ikpe ahụ nke ọnụ na-ekwuru ndị uweojii Enugwu steeti bụ Daniel Ndukwe binyere aka, kwuru na ha nchọpụta gosịrị na na aka Ozonwanji Joseph dị n’ọnwụ otiegwu ahụ.
Ka ọ dị ugbua, achụọla Ozonwanji Joseph n’ọrụ dịka onye uweojii ebe a nọrọ taa kpọpụ ya n’ụlọikpe nta dị n’Enugwu East.
Onye ọkaikpe ụlọikpe ahụ nyere iwu ka a kpọchie nwamadị ahụ n’ụlọmkpọrọ dị n’Enugwu ma nyefee akwụkwọ ikpe ya n’aka Ọkaikpe kachasị n’Enugwu steeti maka nnyocha ndị ọzọ.
Kọmishọna ndị uweojii steeti ahụ bụ Kanayo Uzuegbu ezigala ozi iti aka n’obi nye ezinaụlọ otiegwu ahụ ma kwe nkwa na ha ga-enweta ikpe ziri ezi maka ọnwụ Igbo-jah.
Ndị uweojii agbaala onye otu ha gburu Igbo-Jah n'anwụ

Ebe foto si, Enugu Police Command
Ndị uweojii Enugwu steeti ekpugheela aha nakwa foto onye otu ha a na-enyocha maka ọnwụ otiegwu Chikezie Okezie Nwamba a ma dịka Igbo-jah.
Nke a pụtara ihe n'ozi nke ọnụ na-ekwuru ha bụ Daniel Ndukwe weputara.
N'ozi ahụ, o kwukwara na Kọmịshọna ha na steeti ahụ bụ Kanayo Uzuegbu nakwa ụfọdụ ndị gọọmentị agaala mgbaru n'ụlọ otiegwu nwụrụ iji ti ezinaụlọ ya aka n'obi.
"Uzuegbu rịọrọ ndị niile ọnwụ Igbo-jah metụtara ka nwee okwukwe na ndị uweojii ga-enye ikpe ziri ezi n'okwu a.
Dịka ihe si kwụrụ ugbua, nwoke ahụ bụ Inspector Ozonwanji Joseph nọ n'ụlọ mkpọrọ ebe Ndukwe kwuru na a ga-akpụpụ ya ụlọikpe ma emechaa nyocha.
Cheta na e gburu Igbo-Jah dịka ọ gara itiri ndịuweojii egwu n'Enugwu n'ụbọchị Satọde nke mere ka ndị ntorọbịa Obiagu mee ngagharịiwe.
A nwụchiela onye uweojii maka ịgbagbu otiegwu n’Enugu steeti

Ugbua, i nwereike inweta akụkọ BBC Igbo niile n'ekwenti gị.
Pịa aka ebe a ka i soro anyị
Ebe Ọkwa azụmahịa WhatsApp kwụsịrị
Ndị uweojii sị ha anwụchiela ma jichie onye uweojii na-arụ ọrụ na ngalaba ụlọọrụ ndị uweojii na-ebu agha megide otu nzuzo n’Enugwu steeti maka ịgbagbu otiegwu bụ Okezie Chikezie Mba, onye a maara dịka Igbo-Jah.
Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii Enugwu steeti bụ Daniel Ndukwe kwuputara nke a n’ozi ọ wepụtara n’ụbọchị Satọde 26 Ọktoba 2024.
Ndukwe sịrị na Igbo-Jah bịara njem nleta n’ụlọọrụ ndị uweojii n’ụbọchị Fraịde 25 Ọktoba 2024 ma dịka ọ na-ala mgbe o jiiri ihe dịka nkeji iri gaa elekere asatọ nke abalị, onye uweojii ahụ gbapụrụ mgbọ ma gbagbuo ya.
Ozi ahụ kwuru na e buuru nwoke ahụ gawa ụlọọgwụ ozugbo bụ ebe Dọkịta nọọrọ kwuputa ya dịka onye nwụrụ anwụ.
Ọ sịrị na a dọnyela ozu nwoke ahụ nwụrụ anwụ n’ọbaozu maka ime ya nnyocha ebe kọnịshọna ndị uweojii Enugwu steeti bụ Kanayo Uzuegbu nyere iwu ka e mee nnyocha miri emi iji hụ na e nyere onye uweojii ahụ ntaramaahụhụ kwesịrị ekwesị.
Ka o sinadị, Kanayo kasiri ezinaụlọ, ndị enyi na ndị ha na Igbo-Jah na-emekọ ihe obi ma kwe ha nkwa na onye ọbụla a chọpụtara aka ya dị n’ọnwụ nwaamadị ahụ ga-anatarịrị ntaramaahụhụ kwesịịrị ya.










