A tabiela nwataakwụkwọ ire n'Abia steeti

A tabiela nwataakwụkwọ ire n'Abia steeti

Ebe foto si, Getty Images/BBC

Oge e ji agụ akụkọ nkeji 2

Nwataakwụkwọ Federal Government Girls College Umuahia atabiela nwataakwụkwọ ibe ya ire oge ha na-ese okwu.

Akụkọ kwuru na Amarachi Chibueze nọ na klaasị nke anọ tabiri Adaeze Chinweoke nọkwa n'otu klaasị ahụ ire oge ha na-ese okwu ka e kesachaara ụmụakwụkwọ ihe oriri.

Ozi anyị nwetara kwuru na e buuru Adaeze gaa n'ụlọọgwụ abụghị nke gọọmenti mana ha jụrụ ịnabata ya.

Ka e mesịrị, ha bugara ya ụlọọgwụ Federal Medical Centre bụ ebe Dọkịta nọọrọ kwuputa na ire ahụ anwụọla.

Onye ntaakụkọ BBC Igbo gara ebe ahụ nụrụ n'ọnụ ụfọdụ mmadụ na a chụọla Amarachi Chibueze bụ nwaafọ Imo steeti n'ụlọakwụkwọ ahụ mana o nweghị ike ịchọpụta n'aka ndị isi ụlọakwụkwọ ahụ ma nke a ọ bụ eziokwu.

Otu nwaanyị nwa ya na-aga akwụkwọ na Federal Government Girls College Umuahia bụ Peace Agbo tara Onyeisi ụlọakwụkwọ ahụ ụta n'ihi elekọtaghị ụmụakwụkwọ anya nke ọma ma bokwaa ebubo na adịghị enyeju ha nri afọ.

Ọ kpọrọ oku ka Onyeisi ụlọakwụkwọ ahụ bụ Dr Mrs Ngozi Idika Kalu pụta gwa ọhanaeze etu ọ si elekọta ụlọakwụkwọ ahụ anya dịka ọ kwuru na e nwetela mkpesa banyere mmegbu ụmụakwụkwọ ewezuga nri a naghị enyeju ha afọ.

Ka ọ dị, onye ntaakụkọ anyị enweghị ike banye n'ime ụlọakwụkwọ ahụ n'ihi na e ji igodo kpọchie ọnụụzọ ya.

Oge anyị kpọrọ ọnụ na-ekwuru ndị uweojii Abịa steeti bụ Maureen Desmond n'ekwentị, ọ sịrị na ya ga-enweta ozi banyere nke ahụ ma zaghachi anyị.