Ndị uweojii anwụchiela onye otu nzuzo a si gburu nwata akwụkwọ ABSU

Emmanuel Uche e gburu egbu

Ebe foto si, Abia State University Uturu/Abia state Police

Ndị uweojii nke Abia steeti ekwuola na ha ejidela nwoke ahụ e boro ebubo ịbụ onye otu nzuzo gburu nwata akwụkwọ ABSU n'ihe onyonyo wuru ewu na soshal midia.

N'ozi ha weputara, ha kwuru na nyocha ha mere duru ha gawa n'ebe akpọrọ Isiukwuato dị na steeti ahụ bụ ebe a nwụchiri nwoke ahụ enyere aha ya dịka Emmanuel Victor.

"Nwoke anyị nwụchiri nọzị n'aka anyị ugbua, ọ kwetara na ọ bụ ya kpara ya bụ arụ, anyị ga-akpụpụ ya ụlọikpe" ka ha kwuru n'ozi ahụ.

O dobeghi anya mgbe ha ga-akpụpụ ya bụ nwoke ahụ ụlọikpe maọbụ ihe ọbụla maka ya.

Emmanuel Uche bụ aha nwata akwụkwọ gụchara Mahadum tupu e gbuo ya.

Lee etu e siri gbuo nwataakwụkwọ ABSU

Nwataakwụkwọ ABSU e gburu egbu

Ebe foto si, Abia State University Uturu

Nkọwa foto, Nwataakwụkwọ ABSU e gburu egbu

Egbuola nwataakwụkwọ gụchapụrụ akwụkwọ na nso nso a na mahadum Abia Steeti dị n'Uturu bụ ABSU na mkpirisi Bekee.

Nwataakwụkwọ ahụ a ka na-achọ ịmata onye ọ bụ ka gụchapụrụ akwụkwọ n'ụbọchị Fraịde gara aga bụ 8 Maachị 2024 dịka e gburu ya taa bụ Mọnde 11 Maachị 2024 n'ebe obibi ụmụakwụkwọ 'Miracle Lodge' dị n'okporoụzọ Uturu/Isiukwuato.

N'oge BBC News Igbo kpọtụụrụ onyeisi otu jikọtara ụmụakwụkwọ mahadum ABSU bụ Chinenye Chidirim Emmanuel, ọ kọwara nke a dịka eziokwu ma kwuo na "ọ bụ n'ebe obibi ụmụakwụkwọ ka njinji ahụ jiri, ọ meghị n'ime ụlọakwụkwọ anyị.

"A magburu nwataakwụkwọ ahụ n'oge nsogbu dara n'etiti otu nzuzo nke ọ nọ n'ime ya na otu nzuzo ọzọ. Ka ọ dị ugbụa, ndị ọrụ nchekwa ebupụla ozu ya n'ebe ahụ," ka o kwuru.

N'aka nke ya, ọnụ na-ekwuru ndị uweojii Abia Steeti bụ Maureen Chinaka kwuru na "ndị uweojii nwetara mkpesa banyere ogbugbu nwataakwụkwọ ABSU n'ụlọọrụ anyị dịka nnyocha na-aga n'ihu ugbua iji kpuhee ibe butere ọnọdụ ahụ.

"Ngwangwa anyị mechara nnyocha, anyị ga-ewepụta ozi banyere ya," ka o kwuru.